You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari: 'Kedụ ihe m ga-emere ndị Igbo meta ha mma'?
Ọsịsa onyeisiala Buhari sara ndị ntaakụkọ ụlọọrụ "Thisday" na-ekpo Obodo ọkụ ọkachasị okwu gbasara ihe o kwuru maka ndị Igbo.
O kwuru na otu onye kwuru na ọ naghị emeta ndị Igbo ọfụma.
N'ọnụ ya, "mgbe m meriri ntuliaka 2015, ewetere akwụkwọ eji tụkọta vootu, m chọpụta na ndị Igbo nyere m vootu na-erughị puku narị itoolu na ụma (198,000) bụ vootu otu okpuru ọchịchị nwere ike inye mmadụ.
"N'agbanyeghị nke a, enyere m ha ọkwa minista anọ, kedụ etu ọzọ ị chọrọ ka m si wee meta ha mma?".
Mgbe onye ntaakụkọ gụnyere onye Igbo bụ onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Amerịka, onyeisiala Buhari kwuru "biko gụpụ onye ahụ makana o dere akwụkwọ megidere m.
"Ya mere m ji tufuo onye dere akwụkwọ na m na-emegide ndị Igbo, ma ya ma akwụkwọ ya".
Akụkọ ndị ga-amasị gị: