Asuu strike: anyị chọrọ ka ha kwụsị abụbọọrụ maka ntụlịaka 2019 - Inec

Onye nkwuchiteọnụ Inec bụ Mike Igini ekwuola na ha akpọkuola ndị otu Asuu ka ha kwụsị abụbọọrụ nke ha bidoro n'afọ gara aga.

O kwuru na nke a ga-enyere ha aka na n'emume ntụliaka nke ga-amalite n'onwa Febụwarị n'ihi na ọtụtụ ọrụ dị na nkwado ntụlịaka bụ ụmụakwukwọ na ndị na-efe ala nna ha na-arụ ya.

Igini kwuru na ndị otu Inec akpọọla nzukọ a ga-anọ n'ụbọchị Fraịde na-abia abia, ka ha na ndị ASUU were nọdụ ala tụlee ya bụ okwu.

O kwuru na ha ji n'aka na nzukọ ha ga-aga nke ọma n'ihi na ọ dị mkpa na abụbọọrụ a bere tupu ebido emume ntụlịaka.

O kwuru na ọ dị mkpa maka na ọnụọgụgụ ndị debara aha ịtụ ntụlịaka n'afọ a akarịala ihe ụmụ Naijirịa na-efe ala nna ha ga-emenwu.

Ya bụ na ikikere ụmụakwụkwọ mahadum dị nnukwu mkpa na ntụlịaka a.

Igini kwukwara na INEC ghọtara ọnọdụ ndị ASUU kama na ọ bụ ebumnobi ha na gọọmentị etiti ga-eme ihe ha kwesịrị ịme ka abụbọọrụ a bie.

Nchọpụta ndị BBC mere gosiri na ndị na-efe ala nna ha ugbua bụ ndị 'Batch A' ga-efecha ala nna ha n'ọnwa March.

Abụbọọrụ a gaba n'ihu, ihe ọpụtara bụ na agaghị enwe ndị ọzọ ga-abanye were bido ebe ndị 'Batch A' kwụsịrị.

Ya bụ na abụbọọrụ a ga-emetụta nkwado ndị kwesịrị ife ala nna ha, nyerekwa aka n'emume ntụlịaka.

Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwuru na abụbọọrụ ha agbasaghị Inec, kama na ha ga-aga nzukọ ha were nụ ihe INEC nwere ikwu.

O kwuru na ha ga-ama ebe ha kwụ ma ha nọsịa nzukọ ahụ.

Akuko ndi ga-amasị gị: