You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boko Haram: Ndị uweojii anyị dị 2000 a na-eziga Ugwu zuru ezu
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Jimoh Moshood ekwuola na ndị uweojiii mmadụ 2000 ezipuru maka ị ga Ugwu Naijiria ebe ndị Boko-Haram na-akpa ike zuru ezu, na onweghị onye gbara ọsọ.
Akụkọ ụlọakụkọ 'Premium Times' wepụtara kwuru na"ndị uweojii dị 167 sọ na 2000 a họpụtara maka ọgụ megide Boko Haram n'Ugwu Awusa, agbaghala ọzụzụ ha." bụ Ibrahim iIdris iji kwado mbọ a na-agba ịpịnyọ.
Mana Moshood kwuru na akụkọ ahụ bụ ogbogbo ụgha.
"Akụkọ ahụ nke kwuru na 167 n'ime ndị uweojii mmadụ 2000 nke onyeisi n ndị uweojii zipụrụ gbara ọsọ abụghị eziokwu, onye egela akụkọ ahụ.
Akụkọ dị mkpa taa
Anambra steeti emeriela n'asọmpị ndọrịtaụka 'President's School debate' nke emere n'Ọka.
Godfrey Oluchukwu bụ onye nọchiri anya Anambra steeti gafere steeti itoolu iji meri ya bụ asọmpị gbadoro ukwu na afọ ri ise na asatọ najiria nwetara nwereonwe
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ bụ ndị si mba Ghana maka onye ọkwọụgbọala ha zuru ohi.
Ndị Uweojii kwuru na ha ji 'acid' wakpo yabụ ọkwọụgbọala tupu ha zuo ya ohi n'Edo.
Na mba ofesi
Ala Afghanistan ejirila ọnwa atọ dọtịa ntuliaka ọkwa onyeisiala ha a na-akwado ịme n'ọnwa eprelu n'afọ 2019
Ha kwuru na ihe butere nke a bụ na ụfọdụ ndị chọrọ iso dọ ya bụ ndọrọndọrọ adibeghi njikere.
N'egwuregwu,
Otu egwuregwu Fulham nakwa Wolverhamptons agbaala onwe ha onye laba onye laba dịka ha sọkọtara mpi ụbọchị Wernesde.
N'otu aka ahụ Leicester City na Manchester city na-achịpụ ya ugbua.
Gee Nkeji nke mgbede a