Benin Migrants: Ndị gbara ọsọ ndụ na Libya emeela ngagharị udo
Akụkọ dịmkpa
Ndị gbara ọsọndụ na Libia emeela ngagharị udo:

Ndị gbara ọsọ ndụ na Libyia ejikọla aka ha na ndị gọọmenti Naijirịa were mee ngaghị udo na Bini
Ha ji ohere ahụ na-adọ aka na ntị ime ka ndị ntorobịa kwụsị isi ụzọ Libia aga mba ofesi makana uru adịghị na ya bụ isi azụ.

Agwara Abigail Lemoh (22) na a ga-enye ya akwụkwọ ikike mba Jamani ma ọ kwụọ puku narị naịra anọ.

Mgbe o ruru Libia, ha nakwa ya otu nde narị naịra, were resị ya onye ọzọ bụ onye goro ya narị naịra puku atọ. Mgbe ọ gbara ọsọ, onye Nigeria ọzo jide ya nawa ya ego ka o were hapụ ya.
Kemgbe ọ natara, onwebeghị ọzụzụ ọbụla. Ọnweghị ebe obibi ụgbụa kemgbe ya na nwanne ya nwechere nsogbu.

Abel so ndị otu a na-akpọ "Hope for returnees". O si Edo steeti.Ya na ejima ya so mee njem na Libia. Ejima ya ahụ bụ nwaanyị nwuru n'ọzara n'ụzọ ebe ha ji ọkpa aga Libia.
Agụ mmiri gugburu ya n'ụzọ mgbe ha na-eme ya bụ njem. Eliri ya n'uzuzu n'ọzara ebe ahụ mgbe ọnwụrụ.

Chioma Onwordi sị Delta steeti.
Ọ nọrọ otu afọ na nga Tripoli tupu ndị IOM akpọlata ya.
Ọ sị na ụmụnwaanyị 200 na-anọ na otu mkpuru ebe ahụ.
Ha anaghị ahụ nrị eri mgbe ụfọdụ.
A na-etikwa ha ihe mgbe ụfọdụ.
Mba Itali ka o bu n'obi ịga.
Boko Hara egbuola otu onye agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
N'aka ọzọ ndị agha "operation Lafia Dole" egbuola Boka Haram mmadụ anọ n'ọgbọ ọgụ Maibukarti dị nso Maiduguri.
Sani Usman bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwukwara na agha ahụ takwara isi otu onye agha.
New Zealand ebidola Referendum

Ebe foto si, Getty Images
Mba New Zealand ga-enwe referendụm nke ha n'afọ 2020.
Ndị mba ahụ chọrọ ịma ma iwu a ga-ahapụ ha ka ha sewe Igbo were na-enweta onwe.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, Zinedine Zidane na-ewu na sọshal midia ugbua
Ụfọdụ ndị nkwado otu Manchester United na-akpalite okwu ka ọ bụrụ ya ga-anọchị anya Jose Mourinho bụ onye nkuzi ha achụrụ achụ.
Gee nkeji anyị ebe a
Ndị isi Ohaneze na Afenifere zutere n'Owere ụnyaahụ n'emume Oge Igbo nke Bekee kpọrọ Igbo day

Nnia Nwodo nọ n'isi ndị Ohaneze gara ya bụ emume, ka Osote onyeisi Afenifere du ndị otu ya bịa.
Otu na-elekọta odịmma ndị mba mmiri bụ PANDEF sokwa n'emume Oge Igbo ahụ.
Ụlọakwụkwọ mahadum nwereike gbape n'ọnwa Januwari

Ebe foto si, Getty Images
Onye kwuru nke a bụ minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige.
Ngige sị na mkparịtaụka ha na ngalaba na ahụ maka ndị nkuzi mahadum bụ Asuu na-aga nke ọma.
Cheta na Asuu wụsara ngwa ọrụ kemgbe ọnwa abuọ, nke mere ụmụakwụkwọ jiri nọdụ n'ụlọ.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na ebuso onwe ha agha na Yemen mebiri iwu etinyere iji kwụsị ọgụ n'obodo Hudaydah.
Ndị agha gọọmentị Yemen na ndị otu Houthi kwekọrịtala na ha ga-akwụsị ịkwa mgbọ mana ọgụ ka na-ada ebe ahụ.
Agha Yemen atala isi ọtụtụ mmadụ kemgbe obidoro n'afọ 2011.
Na egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Mba Qatar ekwuola na ha agaghị ikpebi ugbua banyere atụmatụ ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ Fifa wepụtara maka iko mba ụwa nke afọ 2022.
Fifa chọrọ ka ewelie ọnụọgụgụ ndị ga-eso n'iko mba ụwa site iri atọ na abụọ ruo iri anọ na asatọ.
Gee akụkọ ndị a ebe:
Ihe nkiri nke taa.;











