You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
ASUP strike: "Gọọmentị emezubeghị nkwa ha kwere anyị"
Akụkọ dị mkpa
Otu jikọrọ ndị nkuzi na-arụ n'ụlọ akwụkwọ dị elu nke Politeknik bụ ASUP n'aha ịchafụ amalitela abụbụọrụ.
Onyeisi ha bụ Usman Dutse, gwara BBC na ọ bụ makana gọọmentị etiti emezubeghị nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 nakwa 2017.
Minista agbaala arụkwaghịm
Minista Naịjirịa na-ahụ maka gburugburu bụ Ibrahim Jubril awụsala ọwa n'ọrụ ya, sị na ọ naghị arụzị.
Iwu ala machiri idina mmadụ n'ezi
N'agbanyeghị akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na ọ dịghị n'iwu, kọmishọna ndị uweojii na Legọs bụ Edgal Imohimi, ekwuola na iwu Naịjirịa machiri nwoke na nwaanyị idina onwe ha n'ọha, ma kwuo na o nwere ike ịkpọga gị nga afọ abụọ na ụma.
Na mba Brazil,
Otu nwoke a kpọrọ Euler Fernando Grandolpho agbagbuola mmadụ anọ tupu ọ gbagbuo onwe ya n'ime ụlọụka Metropolitan Cathedral dị n'obodo Campinas.
N'egwuregwu,
N'agbanyeghị na a na-enyocha ụfọdụ ndị na-akwado otu Chelsea maka ịkpaso onye egwu Manchester City bụ Raheem Sterling oke agbụrụ, ọ ka na-enwuke ka ugo.
Ndị otu Premier League nyere Sterling nturuugo "ọkachasị agba na Premier League nke ọnwa Nọvemba" nke mere ya ugboro abụọ ọ na-enweta nturuugo a.
Dike Igbo alaa mmụọ
Ndị mmadụ apụtala ị kwanyere onye bụbu onyeisi Ohaneze Ndigbo nakwa dọkịnta amaama bụ Dozie Ikedife ugwu ikpeazụ n'ọnwụ ya.
Dozie Ikedife dị afọ ira asatọ n'asatọ nwụrụ ụnyaahụ
Ọzọ,
Ndị mmadụ na-ajụ ebe Oby Ezekwesili, Donald Duke nakwa Atiku Abubakar bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nọ ụnyaahụ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nkwekọrịta udo maka ntụliaka 2019.
Gụọ ya n'uju ebe a: Gịnị mere ahụghị Ezekwesili, Atiku n'ọgbakọ 'Peace accord'?
Uchenna Madu bu onye ndụ otu MASSOB apụtala ịkwu na o nweghi onye nwere ikikere ịgbochi ndigbo ịlaghachị ala Igbo maka ntụlịaka n'afọ 2019.
Nke a na-abịa dịka otu akporo IDA n'aha ịchafụ nyere iwu na a ga-ada onye ọbụla nara ala Igbo, ọ kachasị ndị bi n'ugwu awụsa nha ma ha laghachị ala igbo na ntuliaka n'abịa.
Na mba ofesi,
Na mba ofesi ndị uweojii na mba Fransi na-achụ otu nwoke ji egbe wakpo ndị mmadụ n'ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg.
Ha kwukwara na mwakpo a tara isi mmadụ atọ ebe mmadụ iri n'abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a: