You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
MMIA Fire: Ọkụ agbaala ọdọ mmanụ dị n' ọdọụgbọelu Lagos
Ndị ọrụ ịgbanyụ ọkụ emenyụọla ọkụ nwuru n'ọdọmmanụ 'Forte Oil dị n'ọdọụgbọelu, Ikeja.
Onyeisi ngalaba gbatagbata Legọs state bụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA), Adeshina Tiamiyu, gwara BBC na ọ nweghị onye merụrụ ahụ kama na ụgbọ mmanụ nakwa obere akụkọ ọdọ mmanụ ahụ gbara ọkụ.
Tiamiyu kwuru na emenyọla oku ma kwukwa na ha ka na-enyocha ihe butere ọkụ ọgbụgba nke sị na-ụgbaala na-ebu mmanụ siri bido.
Tiamiyu kọwara na ụgbọala na-ebu mmanụ na-agbapụ mmanụ ụgbọala tupu ọkụ nwuru.
Ndị nọ ebe ihe a mere na-eche n'ọbụ ọkụ latrik kpanyere ọkụ ahụ.
Ndị nyere aka menyụọ ọkụ ahụ bụ ndị agha, ndị ọụ gbata gbata nakwa ndị ọrụ imenyụ ọkụ, ndị ọrụ ọdọụgbọelu ( Federal Airport Authority of Nigeria,FAAN) na ngalaba gbatagbata Legos ( Lasema.)
N'aka nke ọzọ, ụgbọala mmanụ ọzọ gbara ọkụ n'Isheri n'okporoụzọ sị Legọs gawa Ịbadan.
Nke a mere dịka ụgbọ ahụ dara ma wụfuo mmanụ n'ala.