Public Schools: Ndị nọ gọọmentị a ga-ekwe ka ụmụ ha gaa akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ọha?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Na mbụ, ọtụtụ mmadụ na-ahụta ụlọakwụkwọ ọha - maọbụ nke gọọmentị hibere - ka mmadụ niile na Naịjirịa na-agakari.

Mana e mechara ruo mgbe ọ bụ ụlọakwụkwọ ndị nkiti, nke a kpọrọ "Private School" ka ọtụtụ mmadụ na-etinye ụmụaka ha.

Atụmatụ a bidoro mgbe ndị agha na-achị Naịjirịa.

Ugbua, ọ dịzị ka ọ bụ sọsọ ndị aka ha esichaghị ike ka na-akpọga ụmụ ha ụlọakwụkwọ nke a a kpọrọ "Public School" na Bekee.

Omume a sitere n'etu ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị hibere jiri bụrụ ebe anaghị enye ụmụaka ụdịrị ọzụzụ ha chọrọ.

Ụfọdụ oge, ọ na-abụ na dị nkuzi n'onwe ha enweteghi ọzụzụ chara chara, nke mere ha agaghị enyenwụ ụmụaka ọzụzụ zuru ezu.

Ebe ndi nkuzi nwere ọzụzụ ọfụma, akwụghị ụgwọ etu o si kwesi, maọbụ mgbe ọ jiri kwesi, na-eme ka ume ọghụghụ gbochere ha ịkụzịrị ụmụaka ihe ọfụma.

Ọzọ bụ na gọọmentị adịghị etinye anya n'ihe banyere agam n'ihu ụlọakwụkwọ ndị a; adịghị enye ha ihe ha kwesiri iji ruọ ọrụ, maọbụ hibere ha ụlọakwụkwọ.

Ọ bụ ọnọdụ a mere ndị mmadụ jiri wepụtata iwu ga-eme ka ndị nọ na gọọmentị itinye ụmụ ha na ụlọakwụkwọ gọọmentị.

Onye wepụtara atụmatụ a bụ Sergius Osei Ogun.

E wezụgara atụmatụ a makana ụfọdụ ndị omeiwu kwuru na ọ ga-emegide ikike dịrị onye ịhọrọ ihe ha chọrọ.

O nwere ndị ihe wutere, mere ha ji tinye ọnụ na ya na Twitter.

Sulaiman Ibrahim dere na ya bụrụ na atụmatụ a gara n'ihu, ụlọakwụkwọ ọha ga-alaghachite etu ọ dị na mbụ.

Onye nwere akara @objz2 jụru ma enwereike ime ngaghari iwe maka ihe a?

@Adeyanj34605578 si na ekwesiri ikene onye wepụtara atumatu a bụ Maazị Ogun.

Na Facebook, Uchenna Ezeh kwuru na atụmatụ a amaka.

"Onye chọrọ ka nwa ya ga akwụkwọ n'ofesi ekwesighị ị gara ala anyị ozi. Ọ bụghi iwu mmadụ ịbụ onye ọrụ ọha."

O nweghi onye BBC hụru ekwenyeghị n'atụmatụ a.

Nke mere ajụjụ jiri bụrụ: "Atụmatụ ọ ka ga-aga n'ihu?"

Akụkọ ndị ga-amasị gị: