You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Omeiwu Onyewinfe eferela APGA aka
Onye na-anọchite mpaghara Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nke nta bụ Gabriel Onyewinfe agbarala APGA ụgbọ nwamkpi, ma banye PDP.
Onyeisi ụlọomeiwu bụ Yakubu Dogara gbara ama nke a oge ọ gụpụtara akwụkwọ ozi nke Onyewinfe detara n' ụbọchị Wenezde.
O kwuru na ihe butere mkpebi ya bụ na 'APGA nọ na nnukwu nsogbu' kemgbe e mechara ntuliaka imeụlọ ha nke mere e jiri nwee ndị pụrụ apọ na-akpọ onwe ha 'APGA ọhụrụ.'