Nigeria Election 2019: Ụzọ iri ị ga-eji abụ onyeisiala Naịjirịa
Ọrụ onyeisiala bụ ọrụ kachasị dị mkpa ma kachasị nwee ikike na Naịjirịa.
A na-asị na Onye isiala Naịjirịa nwere ikikere ọchịchị karịa onye isiala ọtụtụ mba ndị ọzọ, nke a mere ọkwa a ji adọ akpịrị.
Ya mere onye chọrọ ịbụ onye isiala kwesịrị ịkwado nke ọma ma mara kwa ụzọ ọ ga-eji merie.
Akụkọ a na-arụtụ aka n'usoro mmadụ nwere ike iji bụrụ onye isiala Naịjirịa n'oge na-adịghị anya.
Akụrụngwa iji bụrụ Onyeisiala Naịjirịa:
Onye ọbụla chọrọ ịbụ onye isiala Naịjirịa ga-enweriri akụrụ ngwa ndị a;
Ịbụ nwafọ mba Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Tupu ị bụrụ onye isiala Naịjirịa, Ị ga-abụ nwafọ Naịjirịa site n'ọmụmụ.
Iwu kwuru na onye ahụ agaghị abụ nwafọ mba ọzọ ka ọ ghara inwe nkwenye na mba abụọ.
Afọ ole ị gbara
Afọ kachasị obere iji abụ onyeisiala bụ afọ iri atọ na ise (35). Nke mere na onye ruru afọ iri atọ tozuruoke ịzọ ọkwa onyeisiala.
Ogogo agụmakwụkwọ
Ogogo agụmakwụkwọ eji a bụ onyeisiala bụ naanị asambodo ụlọakwụkwọ sekọndịrị.
Anaghị akpụ asambodo akpụ, a ga-akwụsị onye mere nke a ịzọ ọkwa a.

Ebe foto si, Getty Images
Otu ndọrọ ndọrọ
N'agbanyeghi ikike niile n'eso ọkwa onyeisiala, ọ ghaghị ịbụ onye ahọpụtara site n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ịbụ onye otu n'ime ha.
Ọrụ
Tupu mmadụ e tozuo oke ịzọ ọkwa onyeisiala, onye ahụ ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ọha na-eze ọbụla ọ n'arụ.
Ọ ga-eme nke a ma ọfọdụ ihe dịka otu ọnwa tupu a na-eme ntụliaka.
Isi nakwa ahụ izuoke
Onweghi mba ga-achọ ka onyeisiala na-enweghi ezi akọ na uche na-chị ya, ya mere ị ga-abụ onye isi na-ahụ zuru oke dịka iwu na-achị Naịjirịa si kwuo.
Ị gaghị enwe akụkọ ime mpụ
Onye isiala Naịjirịa agaghị enwe akụkọ ime mpụ ọbụla n'ihe banyere emeghi ihe n'eziokwu maọbụ ịkpa agwa aghụghọ.
Ọnọdụ ego
Ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala ekwesighị ibụ onye ego kọrọ n'akpa maọbụ n'ụlọ akụ ya dịka iwu na-achị Naịjirịa siri dị.
Otu nzuzo
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala agaghị abụ onye otu nzuzo ọbụla na Naịjirịa nakwa mba ofesi.
Nzọụkwụ iji tozuo oke n'ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.
- Banye n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, APGA, SDP, PDP, APC/Officialwebsite
Iwu kwuru na onweghi onye ọbụla ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala ma ọ bụrụ na o soyeghi n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a maara aha ya.
I kwesiri ịba n'ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na Naịjirịa. Ị ga-aga debanye aha na wọọdụ ebe isi pụta, ebe ibi maọbụ ebe ị na-arụ ọrụ.
Ndị otu ahụ ga-anabata gị n'uche nke ha ma nye gị akwụkwọ ga-egosi na ịbụ onye otu ahụ.
- Debanye aha dịka onye chọrọ ịzọ ọkwa:
Ọ bụrụ na anabata gị n'ime otu ndọrọ ndọrọ. Ị ga-ekwupụta uche gị nye ndị ndu otu ahụ na ị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ka ha nwee ike họpụta.
- Ihiwe otu achụmnta vootu:
N'iji mee nke ọma dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala, i kwesiri inwe otu kpọrọ akpọ ga-achụrụ gị nta vootu.
Ndị otu a ga-enwe onyeisioche, onye odeakwụkwọ, onye odeakwụkwọ ego nakwa onye na-agụkọ ego.
- Malite ọsọ achụmnta vootu:

Ebe foto si, APC, PDP/Official Twitter
Dịka ihiwechara otu achụnta vootu gị, ihe ọzọ bụ ịmalite ọsọ achụmnta vootu. Ọsọ achụmnta vootu nke onyeisiala kwesiri ka a gbaa ya na steeti niile dị na mba ahụ.
Ị ga-akpọtụrụ ndị ndu ọdịnala, ndị ndu ụka nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ọbụla. Ị ga-agwa ha uche gị n'ịzọ ọkwa onyeisiala ma rịọ maka nkwado ha.

Ebe foto si, Getty Images
- Sochie nta vootu gị n'azụ:
Adala mba dịka i mechara njem ileta ndị i kwesịrị ileta. Ọsọ achụmnta vootu gị ekwesighi ịkwụsị rue oge a ga-eme ntuliaka ahụ.
Ndị otu achụnta vootu gị ga-esochi ntuliaka iji hụụ na-emere ihe niile n'ụzọ ziri ezi n'enweghi nrụrụaka ọbụla.
I soro nzọụkwụ ndị a, i kwesịrị ịhụta onwe gị n'ọkwa onyeisiala nke Naịjirịa.









