Social Media: Ihe atọ ị ga-eme ma ị chọọ ịbụ onye a ma ama

Ị ma maka ndị a na-akpọ "Social Media Influencer" na Bekee?

Ị ma ihe mere ndị na-azụ ahịa na ụlọ ọrụ gbagotere agbagote ji na-achọ ndị a ọfụma ọfụma dị ka ele na-achọ mmiri?

Gịnị bụ ọrụ ha na Social Media?

Gịnị ka ị kwesiri ime maọbụrụ na ị chọrọ ị bụ "Social Media Influencer" na-akpa nnukwu ego?

Ebe "Social Media Influencer" malitere

Jerry Adeyere bụ ọkacha mara na ịkwalite ugwu ndị mmadụ n'ọga nke akpọrọ "Public Relations Specialists" na Bekee kọwara na aha "Social Media Influencer" jiri egwu malitere na soshal midia.

N'ọnụ okwu ya "ndị na-ere ahịa dị iche iche na-achọpụta ndị nwere ọtụtụ mmadụ dịka ndị na-eso ha n'elu soshal midia."

O gara n'ihu kwuo na ndị a kwuo otu ihe ọtụtụ mmadụ na-anụ maka ya.

I nwere ike ịbụ "Social Media Influencer"?

Adeyere kọwara na onyeọbụla nwere ike ibu "Influencer".

"Mana ị ga-abụ onye dị aghara nakwa onye ihere adịghị n'anya"

Lee ihe niilenwereike ime ka ị bụ "Social Media Influencer"

  • I ga na-ekwu ọtụtụ ihe gbasara mmekọrịta ahụ: Nke a na-ara ndị mmadụ ahụ maka ihere mana ọ bụ udị ihe a na-ewu na soshal midia. Ndị mmadụ hụ na ị bụ onye na-ekwupute echiche gị gbasara mmekọrịta ahụ, ndị na-akwado gị ga na-eto.
  • I ga-abụ onye na-akpa ọchị nke ukwu: Nke a bụ ihe ndị ọtụtụ ndị bụ "Influencer" na-eme. Gbaa mbọ hụ na ọ bụ ọnatarachi tupu ị tinye aka n'ọrụ a.
  • Ị ga-abụ onye na-ewepụ ndọkasị ahụ: Makana nsogbu ala akarịala, ndị mmadụ na-abata soshal midia makana a chọrọ ichefu nsogbu na-akpa obi ha.
  • I ga-abụ onye aghara.
  • Ị kwesịrị ị na-ekwu maka ihe ga-emetụta ndị mmadụ n'usoro pụrụiche nke ndị Bekee kpọro "Ranting".
  • Chọpụta ọnatarachi gị ma kwalite ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: