You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 Elections: Ugboro ise onye Igbo so zọ ọkwa dịka osote onyeisiala na Naịjirịa
Alex Ifeanyichukwu Ekwueme
Ekwueme pụtara dịka onye na-azọ dịka osote onyeisiala n'okpuru Shehu Shagari n'afọ 1979 n'okpuru otu National People's Party.
Mmeri Shagari na Ekwueme mere ha ndị mbụ ji ntuliaka banye n'ọkwa onyeisiala nakwa osote onyeisiala na Naịjirịa.
Philip Umeadi
Shagari na Ekwueme meriri Obafemi Awolowo na Philip Umeadi na ntuliaka 1979.
Awolowo na Umeadi pụtara dịka osote onyeisi ya na ntuliaka a gbara ọsọ n'okpuru otu Unity Party of Nigeria.
Ọ bụ obere ọnụ ọgụgụ ka Shagari jiri merie Awolowo na ntuliaka a.
Chuba Okadigbo
Okadigbo bụ onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naijịria n'etiti afọ 1999 na 2000.
N'afọ 2002, Okadigbo gawa otu All Nigeria's People's Party, ebe ọ pụtara n'ọsọ ntuliaka afọ 2003 dịka osote onyeisiala n'okpuru Muhammadu Buhari mana Olusegun Obasanjo na Atiku Abubakar bụkwa onye na-azọ ọkwa ahụ nke ugboro abụọ meriri ntuliaka ahụ.
Edwin Ume-Ezeoke
N'afọ 2003, ndị All Nigeria Peoples Party zipuru ozi na Ume-Ezeoke ga-abụ onye ga-eso Muhammadu Buhari dịka zọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa dịka osote onyeisiala na ntuliaka 2003.
Mana Umaru Musa Yar'Adua na Goodluck Jonathan si otu patị PDP meriri ha na ntuliaka a.
Peter Obi
Obi bụbụ gọvanọ Anambara steeti n'okpuru All Progressive Grand Alliance.
Ọ bụ ya ka Atiku Abubakar họpụtara dịka osote onyeisiala ya n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa.
Ha abụọ n'azọ ọkwa n'okpuru Peoples Democratic Party.
Ha abụọ ga-ezute Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo na ntuliaka 2019.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: