You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra Impeachment: Onye bụ onyeisi ụlọomeiwu iwu kwadoro?
Mgbagwoju anya pụtara dịka akụkọ kwuru na ndị ụlọomeiwu Anambara steeti chuturu onyeisi ha bụ Rita Maduagwu ma họpụta Ikem Uzoezie dịka onyeisi ọhụrụ.
Ajụjụ ndị Anambara kpụ n'ọnụ ugbua bụ onye bụ onye ụlọomeiwu iwu kwadoro?
Ọ bụ Rita Maduagwụ ka ọ bụ Ikem Uzozie onye bụ onye na-anọchite Agụata nke a sịrị na ndị omeiwu họpụtara ọhụrụ?
N'ụbọchị Tuesde, Nọvemba 13, ndị omeiwu Anambara ruru 20 n'ime 30 ka asị chụdara onyeisi ha maka ebubo ọchịchị aka ike, arụghị ọrụ dịka o kwesịrị na mmefu ego.
Mana, Maduagwu gọrọ ma gwa ndị ntaakụkọ n'ụlọọrụ ya na ya ka kwụ chịm chịm.
O kwuru na mbọ ichutu ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi na ndị mere ya agbasoghi iwu.
N'okwu ya, ha enweghị ike ichutu ya na akpọghị ya oku bịa zara ọnụ ya n'ebubo ha boro ya.
Na nkọwa ya, onye ọkaiwu bụ Obele Chuka kwuru na ọ bụrụ n'ezie na ndị omeiwu ahụ zuru iri abụọ n'ime iri atọ dịka akụkọ siri kwuo, na nchutu ahụ bụ ihe ọ bụ.
Obele ,onye bụbu onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu ngalaba nke Anambara((NBA, Anambra) kwuru na ọ dịzịri onye mkpebi ha amasịghị ị ga ụlọikpe ka e kpegharịa ya.
"Ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ha zuru iri abụọ n'ime iri atọ, ọnụọgụ ahụ ezuola iwepụ onye ọbula ha achọghị n'ihi na ọ bụ ihe gbasara ha."
"Mana ị marala n'ụfọdu ha sị na ha dị iri abụọ ,echi ha dị asatọ, ụfọdụ agọ aka na ụkwụ ha."
"Iwu kwuru na ị ga-atụ onye mere ihe njọ ya n'ihu tupu ịwepụ ya, ọ bụrụ na ha atụghị ya njọ ya n'ihu ọ gawa n'ụlọikpe."
Kedụ ka ihe siri kwụrụ ugbua?
O doro anya na gọvanọ na-achị Anambara bụ Willie Obianọ akwadọghị nchụda ahụ.
Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara steetị bụ Edon Adinuba gwara BBC Igbo na Rita Maduagwu ka bụ onyeisi ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ agbanyeghị etu e siri nwaa ịchụtu ya n'oche.
Mana okwua apụtaghị na udo alọghachila n'ụlọomwiwu steeti ahu.
Kama enwere ndị kwe na ndị ekweghị.
Ka ọ dị ugbua, ndị omeiwu 11 sonyere na ndị kwadoro Madụagwu.
Ndị a bụ ndị nọnyere ya dịka ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Oka ,isiobodo steeti ahụ na mgbede Tuuzde.
Nke a pụtara na ọ bụzị mmadụ 19 bụ ndị akwadoghị nchụda ahụ.
Dịka iwu Naijiria siri kwuo, ọ bụ ụzọ abụọ n'ime ụzọ atọ ụlọomeiwu nwere ike ịchụda onyeisi ha.
Maduagwu azaghị BBC Igbo oge anyị kpọrọ ya n'ekwe nti ya nke ọ na-asa ozi anyị zigaara ya.
N'otu aka ahụ onyeisi Komiti mgbasaozi nke ụlọomeiwu bụ Kingsley azaghị kwa anyị .
Ka o sila dị,ọ bụ ụbọchị Tọzde, Nọvemba 15, bụ ụbọchị ụlọomeiwu higharịrị na ha ga-agbakọ ọzọ ka a ga-ama mbe na abụọ nke bụ oke.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: