You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oke ọkụ latrik emebiela igwe okwu n'ụlọomeiwu nta
Akụkọ dị mkpa:
Ndị ụlọomeiwu nta arụghị ọrụ taa makana igwe okwu ha a zụrụ kemgbe afọ 1999 arụghị ọrụ.
Onyeisi ha bụ Yakubu Dogara kọwara na ọ bụ oke ọkụ latrik mebiri igwe okwu ahụ
Ekweremadu ekweteghị na nchọpụta ndị uweojii
Ndị gọvanọ sị mpaghara ọwụwa anyawụ ekwola na ha ekweghị n'ihe ndị uweojii kpebiri na ọ bụ ndị ohi wakporo be Ike Ekweremadu.
Ekweramadu n'onwe ya sị na ọ ga-agbasa ihe nkiri gosiri oge ndị a batara be ya, ịji gosi na ndị a bụ ndị chọrọ igbu ya.
Ụkọchukwu Obinna agbahariala Okorocha
Ụkọchukwu Anthony Obinna bụ aka na-achị ndị ụka katolik n'Owere agwala BBC Igbo na onweghị esemokwu dị n'etiti ya na gọvanọ Rochas Okorocha.
Obinna kọwara na ihe butere iwe bụ makana ya chọrọ ka ndị Imo nwee ọchịchị nke ga-amịpụta mkpụrụ.
N'Afrika
N'Afrika, ndị omekome atọhapula ndị ụmụakwụkwọ ahụ sị mba Cameroon ha tọrọ n'ụbọchị ole n'ole garaga.
Akụkọ na-erute BBC ntị bụ na atọhapụrụ ha taa na nkiti.
Jose Mourinho
N'egwuregwu bọọlụ, otu FA ekwuola na ha ga-arịọ ka ha kpegharịa mkpebi kwuru na onweghị nha ha ga-ada Jose Mourinho maka okwu ọjọ o kwuru na ngwụcha asọmpị Man U na Newcastle gbara ụnyahụ.
Mwakpo ụlọ Ike Ekweremadu
Ndị uweojii ekwuola na mwakpo mere n'ụlọ osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu bụ naanị maka izu ya ohi na ọ bụghị igbu ya na ezinaụlọ ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh Moshood kwuru na ahụrụ ngwaọrụ eji akpaka ụzọ n'aka onye anwụchiri mere nke a mana nyocha ka na-aga n'ihu.
Uweojii kwuru na ndị mere nke a bụ onye akpọrọ Mohammed Yusuf si na Zamfara Steeti nọ n'aka ndị uweojii ugbua nakwa onye akpọrọ Ali gbara ọsọ.
Yusuf wepụtara onwe ya kọwara ndịuweojii na ọ bụ ya na Ali so kpaa mkpakpa ahụ.
NLC chọrọ iwu ụgwọ Opekatampe
Otu jịkọtara ndị ọrụ ekwuola na iwu ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ ga-adịnwu ire n'ime izuụka abụọ ma ọ bụrụ na onyeisiala zigara ya ndị ụlọomeiwu n'izuụka a.
Onyeisi aha bụ Ayuba Wabba kwuru na ezi mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị ụlọomeiwu ga-eme ka nke a dị ire.
N'Ofesi
Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democrats ekpokọrọla ọkwa ọchịchị n'ụlọ nnọchite anya nke mba Amerịka n'ime ntuliaka ha mere.
Ụdị mmerie a bụ nke ha na-enweta n'ime afọ asatọ ga-eme ka ha gbanwe ụfọdụ ebunobi onyeisiala bụ Donald Trump.
N'egwuregwu
Barcelona abụrụla otu bọọlụ mbụ ga-aba n'agba nke iri isii n'asọmpi Uefa Champions.
Ebe Liverpool tara ọkpụ goolu abụọ n'aka Red Star Belgarde na asataghị otu, n'otu aka ahụ agbara Monaco ọkpụ goolu anọ chara acha.