You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lai Mohammed na Zakzaky: Etu nri si bute okwu
Onye na-ekwu eziokwu n'etiti Lai Mohammed na ndị otu Ibrahim El-Zakzaky?
Mohammed kpalitere okwu na soshal midia ka o kwuru na gọọmentị ji nde naịra 3.5 enye Ibrahim El-zakzaky bụ onyeisi otu "Islamic Movement of Nigeria" nri.
"Islamic Movement of Nigeria" bụ ndị eji Shiites mara.
Na-erughi awa ole o kwuputara ihe a, BBC kpọrọ ụfọdụ ndị otu El-Zakzaky, ndị kwuru na ọ bụ asị ka Mohammed na-atụ.
Ha kwuru na ha na-atụkọta ego ọnụ were na-egote ihe ma wegara onyeisi ha n'ụlọ mkpọrọ.
Okwu a mere ndị mmadụ kpụrụ Mohammed n'ọnụ.
Ihe ndị mmadụ kwuru
@farooqkperogi kwuru na ọ dị ka ọ ga-akara Naịjirịa mma ịbụ ụlọ mkpọrọ ebe ọbụzị na onye nọ na mkpọrọ na-aka eripụta ahụ karịa ndị na-agagharịri onwe ha.
@dadiyata gbariri ihe ego a sị na El-Zakzaky na-eri ga-azụtanwu n'ime otu ụbọchị.
@Ennyholar_ kwuru na ebe ọ bụ na a na-eji ụdịrị ego a enye El-Zakzaky naanị nri, gịnị mere gọomentị ekwenyebeghi n'ụgwọ opekatampe ọhụrụ a chọrọ ka ha kwụọ?
Mana ndị ntaakụkọ Oak TV bụ ndị akụkọ a si n'aka ha pụta na mbụ, wepụtara akwụkwọ ha ji rịọ mgbaghara, ma kwuo na ọ bụ mmehie ka ha mere.
Gụọ uche obi ndị mmadụ ka ha kwuru maka ya na Facebook BBC Igbo:
Akụkọ ga-amasị gị