You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Atụọla ndị PDP na-eme ngagharị iwe anwụrụ anya mmiri
Akụkọ pụtara na ndị uweoji tụrụ ndị otu PDP na-eme ngagharị iwe anwụrụ anya mmiri n'Abuja taa.
Ha na-eme ngagharị iwe maka ebubo nrụrụaka ha boro ngalaba INEC mana ndị uweojii tụrụ ha anwụrụ anya mmiri iji chụsa ha.
Rue ugbua amabeghi ma o nwere onye merụrụ ahụ n'ọgbaaghara a.
Cheta na onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki, onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Yakubu Dogara nakwa onyeisi otu PDP, Uche Secondus na-eme ngagharị iwe ugbua.
Iwe ha bụ na ihe pụtara na ntụlịaka ọkwa gọvanọ emere na Osun steeti abụghị ihe ziri ezi.
Ha ji ohere ahụ akpọku INEC oku na ha tinye onye otu ha bụ Ademola Adeleke dịka onye mmeri ntụlịaka osun steeti.
Ha malitere ịme ngagahrị iwe a mgbe ha mechara nzụkọ n'isiụlọọrụ ha nke dị n'Abuja.
Ha si n'ụlọọrụ ha ruo n'ụlọọrụ nke ndị INEC na-ekwu na ndịuweoji nakwa ndị ngalaba INEC bụ nke pati nọ n'ọchịchị ugbua bụ APC.
Ndị ọzọ so na ya bụ ngagharị iwe bụ Dino Melaye, Ben Murray-Bruce, Aminu Tambuwal nakwa Sule Lamido.
Akụkọ ga-amasị gị