You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uche anyị bụ na onye ọrụ Aisha Buharị emeghị ihe a sị na o mere - Nwanne ya
Baban-Inna, bụ onye na-arụrụ nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ọrụ dịka onye enyemaka nọzị n'aka ndị DSS maka ebubo na o ji ọnụdụ ya wee gwuo ndị mmadụ chamdum.
Na nkọwa Aisha Buhari n'ime akwụkwọ onye na ekwuchitere ya zipuru ụnyaahụ, Baban-Inna na-anapụ ndị mmadụ ego n'aha ya. Ego eboro Baban-Inna na ọ nara ndị mmadụ ruru ijiri naira iri abụọ na ise (25 billion), mana oriakụ Buhari kwuru na aka ya adịghị n'ihe a na-eme nwaamadị a.
Nyocha ndị uweoji sị na ha mere na be nwaamadị a chọpụtara na ọ bụ sọọsọ ego a na-akwụ ya dịka ụgwọ ọnwa dị n'akara ụlọakụ ya.
Faruk Baban-Inna, bụ nwanne nwaamadị a gwara BBC na agwa a abụghị ụdịrị ha jiri mara nwanne ha nwoke.
Faruk gara n'ihu kwuo na etu a okwu dị n'aka ndị DSS olilanya ha bụ na a ga-achọpụta na aka nwanne ha di ọcha. Okwukwara na nwunye nwanne ya agara ịhụ ya.
Sulaiman Haruna, bụ onyeisi mgbasa ozi Aisha Buhari kwuru na ọ bụ eziokwu na aka Buhari adịghị n'ihe nwoke a na agabịga, ma kwukwa na ọ bu onye ọrụ ha dere akwụkwọ gbara ama maka ihe a mere.
Dika ọ kwụ ugbua, Baban-Inna no n'aka ndị DSS, ka nchọpụta na-aga n'ihu.