You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọnwụ akpọrọkwuola nwunye Ras Kimono ka ọnwa atọ gachara
Efemena Okedi nwụrụ na-erughi otu ọnwa e lichara di ya bụ Ras Kimono.
Akụkọ kwuru na Okedi bụ nwunye nke atọ Kimono nke ezigbo aha ya bụ Oseloke Augustine Onwubuya, nwụrụ n'isi ụtụtụ Septemba 23, 2018, n'ụlọ ya dị na Magodo, Isheri, na Legọs.
N'agbanyeghi na amabeghi ihe butere ọnwụ ya, akụkọ kwuru na o kwuputara na e nwere etu ahụ si n'eme ya tupu ọ nwụọ ka awa ole na ole gachara.
Oge ha abụọ dị ndụ, ha mụrụ otu nwa nwaanyị n'afọ 2013.
N'ihe ikpeazụ o dere n'elu soshal midia, Okedi chetara ọnwụ di ya ka izu abụọ gafere, ma kpọọ ya 'ọdụm'.
Okedi bụkwa onye na-achịkọta ndị otu egwu Kimono, ma bụrụkwa onye na-elekọta ihe gbasara ọrụ ya.
Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọnwụ ya
Sososoberekon bụ onye ama ama gbasara ilekọta ndị na-eti egwu, kwuru na ọ bụ ihe mwute na Okedi anwụọla.
Otiegwu Sammie Okposo kwuru na ya na ya kpara nkata n'elu Whatsapp tupu ọ nụ na ọ nwụọla n'ụtụtụ a.
Ome ihe nkiri bụ Ejiro Okurame dere ụbọchị Kimono nwụrụ ma dee ụbọchị ezigbo enyi ya bụ Okedi nwụrụ, ma kwuo na ọ ga-aga ezumike maka ikpe nnukwu ekpere.
Cheta na e liri Ras Kimono n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọst, 2018.
Pretty Okafor bụ onyeisi otu ndị oti egwu akpọrọ "Performing Musicians Association of Nigeria" na Bekee gwara onye ntaakụkọ anyị na ọnwụ Ras Kimono na-eme ya ka nrọ.