You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọgụ Boko Haram ataala isi onye agha bụ nwa amala
Ọnwụ Dozie Onyeachonam abụghị mbụ onye agha na-anwụ n'agha, mana ọ bụ nke ruru ndị ma ya n'ọkpụkpụ.
Ọnwụ Onyeachọnam bụ otu n'ime ọtụtụ nke ndịagha Naịjirịa na-anwụ kemgbe Boko Haram bidoro ịkpa mkpamkpa n'afọ 2009.
Akụkọ kwuru na Onyeachọnam nwụrụ ka Boko Haram wakporo ogige ha na Borno Steeti n'ụbọchị ole na ole gara aga.
BBC Igbo jụrụ nwanne ya nwaanyị bụ Chinelo ka ọ nụrụ akụkọ a, o kwuru sị "Ọ bụ eziokwu. Ekwebughi m na mbụ. Enwetebeghi m onwe m ruo ugbua."
BBC Igbo kpọkwara Texas Chukwu bụ onyeisi mgbasaozi ndịagha Naịjirịa ịjụ ya ihe ha ma gbasara ọnwụ Onyeachonam, mana o tụtụghị ekwentị ya.
Ihe ị maghị maka ya
- Onyeachonam ruru ọkwa 'captain' tupu ọ nwụọ
- Ọ gụchara akwụkwọ na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka, Anambara steeti tupu ọ banye ụlọakwụkwụ ndị agha bụ NDA
- Ọ lụrụ nwaanyị n'afọ 2013
- Ọ bụ onye Awkuzu n'Anambara steeti
Lee etu ndị enyi ya n'ụlọakwụkwọ si kwuputa maka ọnwụ ya:
Ọgụ Boko Haram ataala isi ọtụtụ ndịagha nakwa ndị nkịtị kamgbe afọ itoolu e bidoro ibuso ha agha.
Chetakwa na gọọmentị Naịjirịa kwere nkwa ịgbaghara ndị Boko Haram ọbụla chegharịrịnụ.