You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
NDIC: Anyị na-enyocha ndị isi ụlọakụ Skye
Onyeisi ụlọọrụ,'Nigeria Deposit Insurance Corporation' (NDIC) bụ Alhaji Umaru Ibrahim kwupụtara nke a n'ọgbakọ ọzụzụ nke otu a kpọrọ International Association of Deposit Insurers (IADI) Afrịka Regional Committee (ARC) nwere na Legos ụbọchị Wenezde.
Ụmaru kwuru si: . "A na-enyocha ha. O doro m anya na mgbe oge ruru, ndị ọrụ nchekwa ga-arụ ọrụ ha."
Ọ gara n'ihu kọwa na iweta Polaris bank bụ iji chekwa ego ndị tinyere ego n'ụlọakụ ahụ.
NDIC ọkacharamara n'ihe gbarasara ụlọakụ kọwara na ụlọakụ Skye danyere na nsogbu site n'igbazinye ego imeụlọ nakwa ndị biri ego akwụ akwụ n'aka ụlọakụ ahụ nke mere ka e wepụ ndị isi ụlọrụ ahụ n'afọ 2016.
Cheta n'izụụka gara aga, ụlọakụ etiti bụ CBN nakwa NDIC nara ụlọakụ Skye ikike ịrụ ọrụ dịka ọbaego ma gụọ ya aha ọzọ bụ 'Polaris Bank', ebe ha tinyere ijeri dọla abụọ n'ụlọakụ ọhụrụ ahụ.
CBN kpebiri na ọ gaghị etinyezi ego ọbula na ya bụ ụlọakụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:
@MideMrPossible kwuru n' ihe ga-eme mgbe ọzọ ndị mmadụ ga-eru n'ụlọakụ ahụ.
@kingboluwatife kwuru na ihe na-atụ ya ụjọ bụ na ọtụtụ ndị mmadụ agaghị enwezi ọrụ maka mgbanwe a.
Ndị na-ahụ maka ihe gbasara ụlọakụ Skye Bank kwere ndị na-edowe ego n'ụlọakụ ahụ nkwa na ego ha dị ka ọ dị nakwa ndị ọrụ ha ka nọkwa ya n'agbanyeghị na a gbanweela aha ụlọakụ ahụ.
Etu ọ dị ugbua n'ahịa oke Naijirịa, ụlọakụ Skye Bank nwetere uru ruru pasenti 4.05 n'ogo kọbọ 77.
A ga-akwụsị ahịa oke ụlọakụ a bido na Monde na-abịanụ.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ otu n'ime onyeisi ụlọakụ Skye, o tụtụghị ekwentị ya.