You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Idemmiri eriela obodo narị abụọ na Kogi steeti
Ihe ruru obodo narị abụọ nakwa okpuruọchịchị ruru iri anọghịzị n'elu ala ugbua dịka mmiri si n'idemmiri mikpuru ha n'ala na Kogi steeti.
Nke a mere na ndị mmadụ agbahapụla ụlọobibi ha dị icheiche ma gbaa ọsọndụ n'ọgbọ enyemaka e kewapụtaara ha na steeti ahụ.
Yahaya Bello gwara ndị ntaakụkọ na ụlọụka, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ugbo dị ịcheiche nọzị n'okpuru mmiri ugbua.
N'ọnụ ya "mmiri a karịrị nke anyị ji anya anyị hụ n'afọ 2012" ma jirikwa ohere ahụ rịọ gọọmentị etiti enyemaka.
Bello kelekwara ndị ọrụ gbatagbata dị icheiche maka etu ha sị enye aka n'ọdachi a mere.
Ndị ọzọ ihe a metụtara agaala na be ụmụnwanne ndị bi n'elu ugwu ebe ha na-eche ka mmiri belata.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: