Cristiano Ronaldo akpawala ike na Juventus

Nwa Pọtụgaal bụ Ronaldo agaala na mba Itali malite igosi ike ya ebe o nyere goolu mbụ ya na Serie A taa n'asọmpi Juventus na Sassuolo gbara.

O nyere goolu mbụ ahụ na nkeji iri ise wee tụkwasịkwa ọzọ ka nkeji iri na ise gachara.

Sassuolo mechara nye otu goolu n'oge a gbakwụnyere mana Juventus meriri ọkpụ abụọ a satara otu.

Mmeri a bụ nke anọ Juventus na-enweta n'asọmpi anọ ha gbarala ka afọ a malitere.

Ronaldo anọọla n'ama egwuregwu nkeji 320 tupu o nye goolu mbụ ya kamgbe e jiri ego nde paụnd 99.2 wee webata ya n'otu Juventus ahụ.

Tupu a gbaa asọmpi ahụ, onye nkuzi Juventus bụ Massimilliano Allegri, kwuru na ọ naghị eche ya na Ronaldo enyebeghi goolu agbanyeghi na ọ nwaala ihe ruru ugboro 23 n'ime asọmpi atọ ha gbarala.

N'okwu ya; "Anaghị m ele anya ka Ronaldo mee karịa ihe o mere n'asọmpi atọ gara aga.

"Ana m eche na echi nwereike ịbụ ụbọchị ya."

Ronaldo nyere goolu 44 n'otu Real Madrid n'agba asọmpi gara aga, gụnyere 15 o nyeburu n'asọmpi Champions League n'ụzọ inweta nturugo nke atọ n'otu ahịrị.

Juventus na-achọzị ụzọ ibu iko Champions League nke ha na-enwetabeghi n'ihe ruru 20.

Akụkọ ga-amasị gị