You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mberede okporoụzọ n'Awgu ataala isi mmadụ anọ
Mmadụ anọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere n'ụzọ Nkwe/Ezere nke dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ n'Enugu Steeti.
Onye na-akwọ ya bụ ụgbọala bọsụ na ụmụnwaanyị abụọ ndị so eme njem ahụ nwụrụ anwụ.
Ka ọ dị ugbua otu onye n'ime mmadụ abụọ fọrọ ndụ anwụọla fọdụ naanị otu nwoke nọ n'ụlọọgwụ n'Awgu.
Ndị uweojịị na nke a mere ya isi mmadụ anọ lara na ya bụ ihe mberede okporoụzọ taa.
Ndị hụrụ etu ihe a si mee na-akọwa na ụgbọala ahụ kpọpụrụ dịka njikwa ya bụ 'Break' na Bekee mebiri na-enweghizi ike ijikwa ya bụ ụgbọala.
Ndị ahụ kwuru na ya bụ ụgbọala jiri ike kpọba isi na ndagwurugwu dị n'ụzọ ebe ahụ we kwọrie.
Onye uweojii na ahụ maka ụgbọala na-eme njem n'ogbe ahụ bụ Eze Chikwado kpọpụtara aha ndị ahụ lara mmụọ n'ebe ahụ.
Ndị ahụ bụ Josiah Udeh (okwọụgbala ahụ), Clara Awiza, Uzoma Obi na Ifeoma Ilegbunam bụ onye nwuru n'ụlọọgwụ Eagle Hospital nke dị n'Ọgwụ.
Ka ọ dị ụgbụa onye ọrụ BBC bụ Chiagọzie Nwonwu nọ na ya bụ ụlọọgwụ sị na onye fọrọ ndụ ebe ahụ ugbua bụ nwanwoke bụ onye na-enyere ọkwọụgbọala aka aha ya bụ Ifeanyi Okorie nọ na agbata ọnwụ na ndụ.
Onweghị onye na-enyere ya aka maka na dọkịnta ụlọọgwụ ahụ bụ Dkt. Kalụ anọghị nsọ.
Chiagozie hụrụ na Ifeanyi gba ọtọ n'akwa ụlọọgwụ ebe ahụ ya na mmiri ọgwụ 'Drip' e tinyere ya n'ahụ.
Chiagozie kwuru na "Onweghị enyemaka ọzọ a na-enye ya nke bụ na ọ nwere ike ịnwụ maọbụrụ na ọbara n'agba ya n'ime ahụ".
Ndị ụlọọgwụ ahụ jụkwara na Chiagozie agaghị ebupu ya bụ nwaamadị n'ụlọọgwụ ibuga ya ebe ọzọ a ga-eleru ya anya nke ọma.
Onye uweojii bụ onye gara ebe ihe mere si na ọ bụ ndị obodo gbaara ya ama a tupu ya gbagawa ya bụ ebe ahụ.
Sagenti Eze Chikwado sịkwa na ọbụghị taa bụ mbụ ụdị ihe na-eme n'ụzọ ahụ.
Kama ọ sị na ihe bụtere nke a bụ na "ya bụ ụgbọala bọsụ bụ ndị ahụ akaala ezigbo nka nke bụ na ọ kwesikweghị ịna agba n'ụzọ, tinyere na o bu ibu karịrị ya".
Sagenti Eze sị na o teela gọọmenti kwebere nkwa imezi ya bụ ụzọ mana onwebeghi ihe e mere na ya, agbanyeghị isi mmadụ ya bụ ụzọ na-ata kwa izu.
Ọ sị na ya bụ ụzọ nke gara n'etiti ugwu mere ka ọnaaghịa ọtụtụ ụgbọala ahụ ịrị maọbụ rịdaa ya bụ ugwu ọkachasị ụgbọala na-ejicheghị ahụ.
Ozi na-eru aghị ntị ugbua kwuru na ndị nwee ndị ahụ nwuru anwụ abịala na Eagle Hospital ha ndị be Ifeanyi bụ onye nke ka dị ndụ.
Ndị uweojii sị na ihe ha jiri bute ndị ahụ n'ụlọọgwụ ahụ bụ makana ọbụ naanị ya bụ ụlọọgwụ bụ ụlọọgwụ dị na Ọgwụ bụ nke nwere ike ịnabata ndị ọrịa na-anaghị ego ọbụla.
Ka ọdị ụgbụa Ifeanyị amalitele ịnata ọgwụgwọ n'aka dọkịnta ya bụ ụloọgwụ.