Akụkọ kachasị taa: NYSC akọwala ihe mere Davido anọghị ebe ibe ya nọ
Akụkọ kachasị mkpa taa:

Ebe foto si, @Davidoofficial/Instagram
Ngalaba na-ahụ maka ife ala nna n'otu afọ bụ NYSC ekwuola na onye otiegwu bụ Davido naara ikike n'aka ha tupu ọ gaa njem na mba Amerịka.
Nke a na-apụta dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ Davido maka ị gawa njem ọrụ na Amerịka oge ndị ogbo ya ji otu afọ efe ala ha ka nọ n'ogige NYSC.
Onye ọrụ NYSC gwara BBC n'ekwentị na Davido nara ikike a maka nchekwa na mkpuchi onwe ya mgbe o denyerechara aha ka ibe ya.
Ọzọ,

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na Anambra steeti anwụchiela mmadụ ise gụnyere nwata dị afọ iri n'anọ maka iwakpo nwaanyị uche ezughi ezu n'ụmụnze dị n'okpuruọchịchị Orumba South.
Nwaanyị ahụ ihe metụtara bụ onye Arondịzuogu kwuru na ha tọrọ nwa ya nwoke dị afọ atọ.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ na-egosi iwe ha na soshal midia maka na onye ọkpa ọchị bụ Kevin Hart machiri ekwenti na mmemme ya emere n'ụbọchị ụka na mba Briten.
N'uche ha, Kevin Hart nke Amerịka mefere ya bụ ihe oke n'ịmachi ihe dịka ekwentị
N'egwurewgu

Serena Williams etozuola ị ga agba nka anọ n'asọmpị US Open dịka o meriri Kaia Kanepi nke mba Estonia taa.
Aha ya na-ewu ugbua dịka Serena Odogwu na Tennis kwuru na ọ ka chọrọ imụta ụmu abụọ n'ọdịnihu n'agbanyeghị na ọ tara ahụhụ ị mụ nwa nke mbụ ya.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Ihe onyonyo
N'ụtụtụ
Super eagles

Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Septemba 2018 ka a ga-emepe ogige ebe Super Eagles ga-anọ mee nkwado maka izute Seychelles ịmata onye ga-etozu maka Iko mpaghara Afrịka.
A na-atụ anya Henry Onyekuru, John Ogu, na ndị ọzọ.
Ọdọ ụgbọelu Enugu
Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugu nọ na ya ugbua.

N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa September, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu ka ọ bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Bịanụ rụọ ọdọ ụgbọelu Enugu - Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ
Na mba ofesi,
Ọkụ agbapịala ụlọ ebe a na-edebe ihe ochie dị na Rio de Janeiro, isi obodo mba Brazil.

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala ha bụ Michael Temer kwuru na ihe ọkụ mebiri n'ụlọ ahụ gbara afọ narị abụọ, bụ "ihe furu efu Brazil enweghị ike ịgbakọ."
Atụmatụ gọọmentị
Gọọmentị etiti amapụtala ijeri naịra anọ na iri isii na asatọ a ga-etinye n'ịrụ ụzọ Lagos-Ibadan, akwammiri Niger nke abụọ, ụzọ East-West, ụzọ Abuja-Kano nakwa ọrụ ọdọ mmiri Mambilla.
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji:
Lee ihe nkiri nke taa:
Nwaanyị mụrụ ejima anọ akọọla etu ya na di ya si chee afọ asaa tupu ihe iribeama a emee.












