Gịnị kpatara Nigeria ji bụrụ 'agbọghọ na-achaba n'anya mbaụwa' ugbua?

Gịnị na-ebute ndịisiala obodo ndị ọnụ na-eru n'okwu na mbaụwa na Naịjirịa ka ala a na-achụ ha ọsọ?

N'ime otu ọnwa (site na isi mbido ọnwa Julaị ruo ngwụcha Ọgọst), ndịisiala mba Briten, Jamini na Frans abịala njem ọrụ na Naịjirịa.

Emmanuel Macron bụ onyeisiala mba Frans bu ụzọ bịa , ka otu ọnwa gachara Theresa May bụ Praịm mịnịsta ndị mba Briten esochie ya azụ ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst.

Na-erughị ụbọchị abụọ May lara, Angela Merkel bụ onyeisia mba Jamini awụchie, mana gịnị butere ha?

Ha atọ bịara ịkpa maka etu mba ha na Naịjirịa ga-esi enwe mmekọrịta n'ihe gbasara nchekwa, ịgbaga mba ọzọ, ntuliaka 2019 nakwa ihe gbasara ikwalite akụnaụba mba abụọ a.

Eziokwu ihe ha chọ abịa

  • Naịjirịa bụ nnukwu ahịa: Iji ọnụọgụgụ mmadụ ole nọ na Naịjirịa (ihe karịrị mmadụ nde 160) tụnyere ndị nọ na mba Briten (ihe ruru mmadụ nde 65), Frans (ihe ruru mmadụ nde 65) na Jamini (ihe ruru mmadụ nde 80), ihe ọma batara na Naịjirịa ga-etinye mba ndị a n'ọnọdụ ọma ime "aka ajaja ga-ebutere ha ọnụ mmanụ mmanụ."
  • Udo: Udo dịrị n'obodo Naịjirịa, ọ pụtara na etu ndị mmadụ si agbapụ aga mba ọzọ ga-ebelata.
  • Brexit: May chọrọ ka ya na Obodo di iche iche nwee njikọ aka n'ụzọ dị icheiche kemgbe Britein pụchara n'ọgbakọ Europe.
  • Mbiara mbiara: Angela Merkel chọro ka ndị mbiara mbiara si na Africa agbabata Europe belata.
  • Ọru ubi: Ha chọrọ ka akụ na ụba sịi n'ọrụ ubi na-abata n'Obodo Naijirịa.