You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Amabeghị etu ọkụ si baa n'ụlọikpe dị n'Orlu
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na ọkụ bara n'ụlọikpe "Magistrate" nke dị n'Orlu taa, mana ọ sị na amabeghị ma aka mmadu ọ dị ya.
Enwerem kwuru na-agbanyeghị na ndị uweojii na ndị ọrụ gbata gbata ndị ọzọ gbagara ebe ihe a mere, ọtụtụ akwụkwọ dị n'ụlọ ahụ lara n'iyi tupu ha agbanyụọ ọkụ ahụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụlọ a ọkụ metụtara ka kwụ ọtọ, na ọkụ emebeghi ya.
Ụfọdụ ndị akwụkwọ ntaakụkọ dere na aka mmadụ dị n'ihe mere, mana Enwerem kwuru na ha amabeghị maka nke ahụ, dika ha ka na eme nchọpụta ka ha mara nke bụ eziokwu.