You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Otu CAN chọrọ ka ndị Nigeria Kpee ekpere ma buo ọnụ ụbọchị atọ
Samson Ayokunle bụ onyeisi ndị 'Christian Association of Nigeria (CAN)' kwuru na ọ dị mkpa ka ndị ụka Kraịst na gburugburu Naịjirịa buo ọnụ ma mee ekpere maka ọgwụgwọ nsọ Naịjirịa.
Ayokunle kwuru na a ga-eme ekpere a site n'Ọgọst 27 ruo 29, ma kwuo na ekpere na ibu ọnụ a bụkwa maka mkpuchikọta Naịjirịa nakwa ọchịchị onyekwuoucheya nke obodo a, ọkachasị ntuliaka 2019 na-abịa.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi Ayokunle zipuru site n'aka onye enyemaka ya pụrụiche bụ Adebayo Oladeji, taa n'Abuja.
Iji kọwaa ihe mere ekpere a ji dị mkpa, Ayokunle kwuru na tigbuo zọgbuo dị n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụzị ihe ihere nye ọchịchị onyekwuoucheya.
O kwukwara sị ndị isi ụlọụka niile dị na mpaghara Naịjirịa gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ mere ekpere a.
N'aka ọzọ, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta Leah Sharibu nakwa ụmụakwụkwọ Chibok nọ n'aka Boko Haram.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị