You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye nta akụkọ "Premium times" ka nọ na nga
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na Naịjiria bụ Jimoh Moshood ekwuola na ya amaghị ka esi nwụchie onye ntaakụkọ ''Premium Times."dika ụlọọrụ mgbasa ozi 'Daily Post'' siri depụta.
Ndị Premium Times bụ ụlọọrụ ebe Ogundipe na-arụ depụtara na a nwụchịrị Ogundipe maka ebubo e boro ya na o na-ede akụkọ na-ezighị ezi gbasara ndị uweojii Naịjirịa.
Mana ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ayọ ka a tọghapụ Samuel Ogundipe makana ọchịchị a nọ na ya ụgbụa bụ ọchịchị onye kwuo uche ya.
N'ọnụ ya, "A machaghị m maka nwụchị a mana otu ihe m mara bụ na ndị uweojii nwere ike sị onye ọ bụla bụ onye Naịjirịa bia ka enyocha ya."
@realFFK na-ayọ osote onyeisiala Naịjirịa na-anọchite anya onyeisala ụgbua ka ọ nye iwu ka a tọghapụ Ogundipe.
@GovAyoFayose kwuru ka ụmụ Naịjirịa kaatọ etu esi nwụchị Ogundipe ma na-ayọkwa ka a tọghapụ ya.
@AmnestyNigeria na-eti iwu ka akpọpụta Ogundipe makana ọrụ mgbasa ozi abụghị mpụ.