You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rochas enyeela ndị Imo ezumike ọrụ maka PVC
Imo steetị enweela ụbọchị ezumike abụọ!
Gọvọnọ Imo steeti bụ Rochas Okorcha kwuru na ụbọchị Wesdee bụ Ọgọóst 15 na Tọọsde bụ Ọgọọst 16 ga-abụ ụbochị ezumike na steeti ha.
Nke a bụ maka ị nye onye ọbụla ohere i jee nata akwụkwọ ntulaka ha nke Bekee kpọrọ PVC.
Ndị agha Naịjirịa nọ n'ugwu na-ewe ezigbo iwe ugbua
Ha mere nghagharị iwe makana ha nụrụ puke puke na ndị na-achị ha chọrọ izipu ha gawa ebe ọ na-ekpo ọkụ n'agha Naịjirịa na Boko Haram.
Ndị agha a jiri iwe na-agba egbe na odo ugboelu ma jụọ cha cha na a ghaghị aba ụgbọ elu ha.
Mmadụ 39 anwụọla na Idlib n'ime mba Syria
Na mba ofesi, akwa ohụrụ na-ebe n'obodo Idlib n'ime Syria dịka ogbunigwe si gbariri otu ụlọ nakwa gbuo mmadụ iri atọ na itoolu.
Mmadụ iri na abụọ n'ime ha bụ ụmụaka. Amabeghí ihe kpatara ogbunigwe jiri gba, mana agha ka na-ada na Syria.
Ihe niile mere na Premier League
N'egwuregwu, Manchester City emeriela Arsenal ọkpụ abụọ na-asaghi ihe n'asọmpị Premeir League ha gbara unyahụ.
Liverpool meri kwa West Ham ọkpụ anọ asatara ihe.
Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a
Ihe nkiri nke taa: