You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
APC na-aṅụrị maka ntuliaka emere ụnyaahụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ka anyị bido na ụfọdụ ntulika emere na steeti dị iche iche ụnyaahụ:
Na Katsina, Maazi Ahmad Babba-Kaita bụ onye zọọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'okpuru APC meriri nwanneya nwoke bụ Kabir Babba-Kaita bụ onye PDP na mmegharị ntuliaka iji nwete onye ga-anọchịte anya Sịnetọ Mustapha Bukar nwụrụ n'ọnwa Epreelu nke afọ a.
Ahmad nwetere vote karịrị puku nari iri abụo na anọ 224,607, ka Kabir, bu onye toro ya, nwetere vootu ji obele karia puku iri ise na itoolu
APC jiri twitter kele Ahmad.
Na Bauchi
Ndị APC na-ekwukwa na ọ bụ ha meriri ntulika nke a ga-eji nwete onye ga-anọchite anya Sịnetọ Ali Wakil nwụru n'ọnwa maach nke afọ a.
Ọnụ ọgụgụ vootu gosiri na Lawal Yahaya Gumau nke APC nọ n'ihu. Yabụrụ na ihe ka dị etu a, ọ ga-egosi na gọvanọ chịbụrụ steeti ahụ bụ Isa Yaguda achịtaghị aja na ya bu ntulika. Yaguda zọrọ ọchịchị a n'okpuru otu pati GNP.
Ebe ọzọ emere ntuliaka bụ Kogi steeti na Cross River steeti.
Na Mba Ofesi
ndị uweojii na Kanada akpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka ogbugbu mmadụ anọ, nke mmadụ abụọ n'ime ha bụ ndị uweojii.
Oweojii si na Mathew Vincent Raymond dị afọ iri anọ na asaa gbụrụ ndị a obodo Fredericton nwanne ụnyaahụ.
N'egwuregwu,
Otu goolu nwaafọ Naịjirịa bụ William Troosk-Ekong nyere ezughi inyere Bursapor aka imeri Fenerbache.
Feneerbache mechara asata ọkpụ gọọlụ abụọ jiri nwete mmeri.
Asọmpị ahụ bụ nke bụ nwaafọ ghana bụ Andrew Ayew ga-agbara Fenerbache mana ọchitaghị aja tupu ewepụya.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: