Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị agha ụgbọelu 'egbuola ndị omekome 20'

Akụkọ ndị dị mkpa

Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa atụọla ogbunigwe ma gbuo ndị na-eyi ndụ egwu dị iri abụọ n'obodo Yanwari na Mashema nke Zamfara steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha ụgbọelu bụ Ibikunle Daramola bu onye zipuru ozi banyere mwakpo a.

Minista na-ahụ maka ọkụ bụ Babatunde Fashola ekwupụtala na ọkụ Latrik Naịjirịa na-ewepụta ugbua dị megawatt puku asaa

Fashola gara n'ihu kwuo na ministri ya arụọla ọrụ pụtara ihe n'ime afọ atọ gara aga kama na-enwere ọtụtụ ihe ka fọdụrụ.

Na mba ofesi,

Akụko ndị nchekwa United Nation wepụtara ụnyaahụ na-egosi na mba Nọt Korịa ka na-aga n'ihu na mmepụta nakwa orire ngwaagha nuklia.

Dịka ọ dị ugbua mba Nọt Koria ekwubeghi ihe ọbụla banyere akụkọ a ma ọ bụ eziokwu, ka ọ bụ asị.

N'egwuregwu,

Ụmụafọ Naịjirịa gụnyere Blessing Okagbare, Joy Udo-Gabriel, Tobi Amusan na Rosemary Chukwuma atụrụla ugo ọlaedo n'ọsọ relay n'egwuregwu atiletiks na-eme n'Asaba.

Ebe Semenya nke mba Saụt Afrịka maburu ọlaedo nke ya n'ọsọ mita narị anọ.

Ihe nkiri nke taa