You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Pope anabatala akwụkwọ arụkwaghịm Archibishop McCarrick maka ebubo mmetọ umụaka
Pope Francis anabatala arụkwaghịm nke Theodore MaCarrick bụbụ archibishop Washington degara ya.
N'akwụkwọ ozi Vatican depụtara, Fada McCarrick zigara Pope akwụkwọ arụkwaghịm ya n'abali Fraide.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Guardian siri kwuo, e boro McCarrick ebubo mmetọ ụmụaka n'ụzọ mmekọahụ n'izuụka ole na ole gara aga.
Akwụsịkwara ya bụ Archibishop ịdụ usoro ekpere kemgbe ụbọchị 20 nke ọnwa Juun iji nyocha ebubo eboro ya na ọ metọrọ otu nwata n'afọ iri anọ gara aga.
Nwoke ọzọ tụrụ ya aka na ọ metọkwara ya mgbe kemgbe ọ dị afọ iri n'otu rue mgbe ọ toputere dịka ntorobia.
Pope Francis agwala ya si ya "bie ndụ mwute na ekpere" rue mgbe a ga-emecha nyocha mara ma ikpe amara ya maọbụ na ọ maghị ya.