You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee eziokwu ihe mere n'ụlọ Ekweremadu
Ndị uweojii na ndị ọrụ EFCC gbara ụlọ Ekweremadụ gburugburu ụnyaahụ, dịka ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichukwu si kwuo.
Anichukwu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ọ bụghị naanị ndị EFCC bịara, n'agbanyeghị na ndị uweojii kwuru na ha abịaghị gbochie Ekweremadu.
O kwukwara na ndị uweojii agụta agụta gbara ụlọ ya gburugburu dịka ọ bụ okeọhịa Sambisa .
O kwukwara na o nwere ka ọ dị maka na ndị EFCC zitere akwụkwọ ozi ha ji kpọọ Ekweremadu oku ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ndị ha boro ya, ma bịakwa n'ime otu ụbọchị ahụ ịbịa gbochie ya ịza ya bụ oku.
N'okwu Ekweremadu gwara ndị ntaakụkọ ka mgbochi ya kwụsịrị, o kwuru na ndị EFCC gbochiri ya ruo awa isii.
Anichukwu kwuru na ha ekweghị ndị mmadụ pụọ maọbụ bata.
Ihe ndị omeiwu bịara mee
Anichukwu gwara BBC Igbo na ndị omeiwu (ma ndị PDP ma APC, ma ndị ugwu, ndịda, ọwụwa-anyanwụ na ọdịda-anyanwụ) bịara ileta Ekweremadu, na ọbịbịa ha gosiri na nkwado ha kwụ chịm.
Gere ihe Anichukwu gwara anyị n'uju: