Ihe ọma e merela ụmụ Naịjirịa tọrọ na Rọshịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye ọgbasa ozi onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu denyere n'akara ya na Twitter na Buhari agwala Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ka ọ hazie etu a ga-eji kpọlata ụmụ Naịjirịa tọọrọ na Rọshịa.

Ndị a tọọrọ so na ndị gara ikiri iko mbaụwa, mana ọtụtụ n'ime ha tọọrọ mgbe ha ruru ebe ahu chọpụta na ndị aghụghọ aghọgburu ha.

N'ozi a o dere, Shehu sị na onyeisiala sị ka eme ihe niile a ga-eme n'ịhụ na ndị a lọtara.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Onyeama amalitela ọrụ n'ịhụ na ihe gara etu onyeisiala siri kwuo.

Ma kwukwa na ihe a na-eme bụ site na-etu onyeisiala jiri chọ ịhụ na ndị Naịjirịa nwetara nchekwa ebe ọbụla ha nọ n'ụwa.

Gọvanọ na-achị Legọs bụ Akinwumi Ambode kwụru ụgwo ka mmadụ 50 tọọrọ na Rọshịa lọta.

Yulia Siluyanova, bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndi a na-emegide na Rọshia, gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ, ma kwukwa na ha ga-ahụ na ndị a tọọro ga na-eri nri ruo mgbe ha malitere njem ịlaghachị Naịjirịa.