Akụkọ kachasị n'Abali a: Igbo ajụla mmapụta ogige ebe a na-azụ ehi
Ndị Igbo akatọla atụmatụ ogige ebe a na-azu ehi

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti mapụtara ịrụ ogige a na-azụ ehi nke a kpọrọ 'ranch'na steeti iri na Naijria nakwa ịmapụta egọ karịrị otu ijeri naịra maka atụmatụ a.
SERA sị na ihe ndị omeiwu mere bụ mmegide ikike diri mmadu

Ebe foto si, Getty Images
N'aka ọzọ, otu kwụụrụ onwe ha bụ SERAP n'aha ịchafụ akatọọla agwa ndị omeiwu kpara site na ịkpachapụ ihe n'ego a mapụtara na Bọjetị afọ a iji rụọ ọrụ ndị mkpa na Naịjirịa
Ha kwuru na agwa ndị a kpara megidere ikike dịrị onwe nke ndị ala anyị.
Okwu ndị mbịambịa apụọla ụlọ omeiwu US

Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu Mba Amerịka ga-eme ntụlịaka gbasara okwu ịgbasa ezịnaụlọ ndị mbiaramiara na mba ahụ.
Onyeisiala ha bụ Donald Trump kwuburu na ha agaghịzị agbasa ndị ezịnaụlọ ha nọ na mba Amerika ịbata obodo ahụ.
Denmak na Ọsrelịa agbala onwe otu ọkpụ ọtụ ọkpụ

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu Iko mbaụwa, Denmark na Ọstrelia ewerela otu ọkpụ gba onwe ha ọnye lawa onye lawa n'asọmpị ha gbara n'ehihie taa.
Ndị Ajentina na Kroeshịa ga-akwata n'elekere asaa nke abalị.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị











