Ndị uweojii na-achọ ndị 'gburu' igwe ndị Akpugo Nkanu n'Enugwu

Ndị nzew na ọzọ

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu, ekwuola na ndị uweojii amalitela nyocha ịmata ihe kpatara nsogbu dịbu n'etiti Igwe ndị Ọgbọzinne, Akpugo, bụ Steven Nwatu na ndị obodo ọ na-achị nke tara isi ya bụ onye eze.

Nchọpụta gosiri na esemokwu ahụ bịdoro kamgbe afọ iri, Steven Nwatu were oche dịka onyeeze.

Ndị obodo kwuru na okweghị ka ahọpụta ndị otu na-achị obodo a na-akpọ 'Town Union'.

Nke a mere ndị obodo jịrị gaa oge na adịghị anya mee ngagharị iwe n'ụlọ gọọmentị Enugwu ma kpọpụ eze ahụ n'ụlọ ikpe.

Ndị hụrụ mgbe ya bụ ọdachị mere kwuru na ndị otu igwe na ndị ọzọ na-alụ ọgụ, oge agbara igwe ahụ ọtọ ma kụọ ya ihe nnukwu.

E buru ya gbaga n'ụlọọgwụ Parklane Enugwu, ebe ọ nọ wee nwụọ.

Akpugo
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ