You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ Kachasị n'ụtụtụ a: G7 ewepụtala $3b ị kwalite ụmụnwaanyị
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a
Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu ekwuola na Gọmentị etiti ga-emezu nkwa ha kwere ndị Naịja Delta n'ihe gbasara nchekwa obodo ha
Nke a bịara ebe ndị ntorobia ahụ na-ebo ndịagha Naịjirịa kwesiri ị chekwa ha ebubo ohi mmanụ agbidi.
Ọzọ na Naịjiria
Lagos steeti na steeti ndị ọzọ dị na ọdịda anyanwụ Naịjirịa etinyela ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike.
Akwukwo e depụtara gbasara iwu a, nke gọvanọ Ambode binyere aka na-ekwu na ọ bụ iji kwanyere ụbọchị onyekwuoucheya ugwu o kwesiri.
Ijeri dọla atọ maka ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị
Lee ebe Malala Yousafzai gosiri nkwado ya maka okwu a na soshal midia.
Mba Canada na mba ndị ọzọ nọ n'otu G7 ekwela nkwa ị wepụta ijeri dọlla atọ ị ji hụ na ụmụnwaanyị nwereike gụọ akwụkwọ dị ka ibe ha.
Ego a ga-akwalite ngalaba ọgụgụ akwụkwọ na mba dị ịccheiche n'ụwa niile kachasi ebe ndị e nwere ọgbaghara .
N'Egwuregwu,
Otu bọọlụ mba Kamerun akpọrọ Lioness ejila ọkpụ iri asataghị otu merie otu bọọlụ mba Congo n'asọmpị ha gbara.
Nke a mere na Lioness etozuola ị sonye n'asọmpị nke iko mba Africa ụmụnwaanyị.
Gee nkeji nke ụtụtụ a: