You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari na Super Eagles nwere ọgbakọ taa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onyeisiala Muhammadu Buhari zutere ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles n'isi ụlọ ọrụ Naịjirịa n'Abuja taa.
Nzụkọ a bụ otu n'ime ihe ndị Super Eagles ji akwado ọpụpụ ha ịga Rọshịa ebe a na-asọmpi iko mbaụwa afọ a bụ 2018.
Ụlọọrụ onyeisiala nọ n'akara ha na Twitter taa gosipụta etu ya bụ ogbakọ siri gaa.
Onyeisi ụlọọrụ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick gwara onyeisiala na ndị nọ na Super Eagles na-aga Rọshịa bụ ndị e hiri asaa n'anya wee họpụta.
Pinnick kwuru na ga-emepụta Naịjirịa ihu, ebe o kelere onyeisiala maka ohere o nyere ha ịhụ ya.