You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ngige ekwuola na agaghị ebuli ụgwọ opekata mpe na Septemba
Minista na-ahụ maka ọrụ na iwe ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na o cheghị na gọọmentị ka ga-ebulinwu ụgwọ ọnwa opekata mpe nke ndịọrụ a na-akpọ 'minimum wage' na Septemba.
Ngige kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ n'Abuja ụnyaahụ, kwuru na Septemba abụghị oge ha hibere iji bulie ụgwọ ọnwa opekatampe, kama na ọ bụ oge ha yiri izukọ wee kaa okwu ọnụ n'ihe gbasara ma a ga-ebuli maọbụ agaghị ebuli ya bụ ụgwọ.
"Kọmitee nke na-ahụ maka ịwepụta ụgwọ opekatampe ọhụrụ kwesịrị ịka okwu ọnụ na ngwụcha Septemba, ma gwa gọọmentị ihe ha kpebiri ka ha nwee ike tulee ya ma nabata ya tupu e ziga akwụkwọ ọrụ ya n'ụlọomeiwu ukwu."
Ngige kwuru na ikike ịkwụ ụgwọ a so n'ihe kacha mkpa ha ga-elebanye anya ka ha na-ekwu maka ụgwọọnwa opekatampe a.
O kwuru na ọ bụ ịmata ihe ndị ọ gbasara gụnyere ndị ọchịchị obodo nakwa ndị ọrụ na-abụghị ọrụ gọọmentị chere, mere kọmitee ha ji bido ịgagharị gburugburu Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ka ha na-eme ngagharị a ka ha ji hụ na ụfọdụ ndị ọchịchị obodo tinyere akwụkwọ ka e bido ịkwụ ego sitere na puku naịra iri abụọ na abụọ (N22,000) ruo puku naịra iri ise na asatọ (N58,000), ebe ụfọdụ kwuru ka ha ka na-akwụ puku naịra iri na asatọ (N18,000) maka na ọ ka na-ara ụfọdụ steeti ahụ ịkwụnwu nke dị adị.
Ngige kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ kwenyere na etu ụgwọ opekatampe a ga-esi dị ire bụ na a ga-atulegharị etu e si ekesa ego a na-enweta ugbua ka o nwee ike bara ndị steeti nakwa ndị ime obodo.