Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob biko gbaghara - Ọhaneze Ndigbo
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ohaneze ndị Igbo akpọkuola Ipob

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu ntorọbịa Ohaneze Ndị Igbo akpọkuola ndị IPOB sị ha gbaghara ma kpee udo.
Ha gwara IPOB sị na ndị agbụrụ na mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa ebidola ikwu maka nhazi nke bekee kpọrọ 'restructuring'.
Amnesty International ebola ndị agha ebubo

Ebe foto si, AFP
Otu na-ahụ maka mmegide na ikike mmadụ nwere bụ Amnesty International ebola ndị agha Naịjirịa ebubo iwakpo ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ nọ n'ogige ebe ha na-agba ọsọndụ maka Boko Haram.
Ha kwuru na ndị agha na-ebu ụzọ kwe ha nkwa ịnyere aka site n'inye ha nri na ihe ndị ọzọ. Mana otu ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na ọ bụghị eziokwu na ihe a na-eme.
Okwu "Nuclear" Iran

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala ndị mba Germany bụ Angela Merkel ekwuola na China na Germany ga-akwụdo na nkwekọrịta ihe gbasara Nuclear nke ndị Iran, n'agbanyeghị na mba Amerịka pụrụ na mbido ọnwa a.
Merkel kwuru nke a ka ya na Li Keqiang bụ onyeisiala ndị China zukọrọ oge ọ gara njem ọrụ ụbọchị abụọ na China.
N'egwuregwu

Ebe foto si, @EnyimbaFC
Ndị Enyimba ji otu ọkpụ goolu na-asataghị ihe merie Niger Tornadoes ụnyaahụ.
Mmeri a mere ka Enyimba rigoo n'ọkwa asatọ na ndị kachasị agba n'asọmpi NPFL ugbua.
Gee ya na nkeji nke ututu a:
Lee ihe nkiri taa
Onye na-akwalite egwu ụka ama ama bụ Anthony Umeh a.k.a Honesty Music ekwuola etu esi o si kwalite ndị ọgụegwu ụka dịka Frank Edwards na ndị ọzọ ama ama na Naijirịa taa.













