You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enyimba meriri Tornadoes Unyaahụ N'asọmpị NPFL
Aha Emeka Obioma onye otu Enyimba FC na-ekpo ọkụ ukwuu ugbua makana ọ bụ onye nyere Enyimba aka i nweta mmeri n'asọmpị NPFL ha na ndị Niger Tonadoes gbara ụnyahụ n'ọgbọ egwuregwu nke Calaba.
Enyimba meriri Niger Tornadoes otu ọkpụ na asataghị ihe.
Obioma nyere goolu nke nyere Enyimba mmeri a oge nkeji iri itoolu kụrụ kpọm.
Mmeri a mere ka Enyimba rigo n'okwa asatọ na ndị kachasị agba n'ime NPFL ugbua.
N'asọmpị Akwa United na Go Round FC, ọ bụ United bụ ndị nwe mmeri.
Ha ji ọkpụ otu na asataghị ihe gbapụ Go Round FC n'ọgbọ egwuregwu nke Godswill Akpabio n'Uyo.
Paul Obata bụ onye pụtara dịka dike n'asọmpị a, o nyere goolu a na nkeji iri anọ na ise.
Akwa United rigo okwa nke isi maka mmeri a.