You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị taa: Nọt Koria chọrọ ịgbaha ọgbakọ ha na Amerịka
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ụlọịkpe pụrụịche na-ahazi ka onye si-eme n'ọrụ gọọmentị bụ Code of Conduct Tribula na bekee, ekwuola na o nweghị ihe Jostis Sylvester Ngwuta mere.
Nke a bụ maka okwu gbasara ekwupútaghị akụ na ụba ya ha n'ezie.
Ebe ọzọ na Naịjirịa...
Gọọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ijeri naira 10 na idozi Benue steeti na steeti ndị ọzọ ndị ọchịehi mebiri ihe.
Ọkammụta Yemi Osinbajo bụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru nke a ebe ọ gara nleta iti aka n'obi na Benue steeti.
N'otu aka ahụ, akpụpụla onye ndu ndị Shiites n'ụlọịkpe ịzara ọnụ ya maka ebubo ịbute ọgbaaghara n'obodo.
Cheta na e jichiri ya na nga kemgbe afọ 2015.
Akụkọ ofesi
Onyeisiala mba Nọt Koria na-ekwu na ha nwere ike ị gbahịị nzụkọ ga-adị n'etiti ha na mba Amerịka ma ọ bụrụ na Amerịka jisike na-akwanye ha ọkụ n'ike maka ngwa agha nụklịa ha.
Kim Jong-un na Donald Trump kwesiri ị zuko n'ụbọchị 12 nke Jun n'obodo Singapore ị kpa maka odinihu mba ha abụọ.
N'Egwuregwu,
Ebe niile kwuru jim n'ọgbọ egwuregwu villa park ụnyaahụ
Nke a bụ iji kwanyere onye ọgba bọọlụ ọchie otu Aston Villa Jlloyd Samuel nwụrụ na mberede okporoụzọ.
Gee ya nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo nke taa: