Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: 'Gọọmentị gbakọtara anyị azụ' - Nne Leah Sharibu
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ebe foto si, Getty Images
Nne Leah Sharibu, bụ nwata akwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ na Dapchi ma jụ ịhapụ maka na ọ bụ onye ụka Kraịst, ekwuola na ndị gọọmentị gbakọtara ya azụ.
Nwaanyị a kwuru sị "naanị ndị otu nzukọ Kraịst na-abịa ileta anyị. Enweghị onye si gọọmentị. Anyị nọọrọ onwe anyị."
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na atọrọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ na mpaghara Kaduna steeti.
Ndị uweojii kwuru na ọ bụghị eziokwu na atọrọla ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị njem a si kwuo, mana enweela ndị atọrọla n'akụkụ ebe ahụ na nso nso a.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
A tụọla nwoke dị afọ iri abụọ na isii nga mkpụrụ ọka afọ narị abụọ na iri ise na Saụt Afrịka.
Ikpe mara nwoke a bụ Shadrax Xidada Chauke maka ebubo mwakpo n'ike iri abụọ na atọ na ịnwa igbu mmadụ ugboro abụọ nakwa izu ohi na ịtọ mmadụ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru isonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ.
Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti.
Cheta na ndị NFF na onye nchịkọta otu Naịjirịa bụ Gernot Rohr wepụtara aha mmadụ atọ ga-eso asọ mpi a na Rọshịa.
Gee nkeji anyị na mgbede a:
Ihe nkiri taa
Patrick Utomi gwara BBC Igbo ihe atọ dịkarịchara mkpa ọ chọrọ imezu ma ọ bụrụ gọvanọ na Delta steeti.











