You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abia na Enugwu steeti akọwala ka ha si dị njikere maka ide mmiri
Enugwu na Abia bụ steetị ndi dị na mpaghara ọdịda Naịjirịa ekwụrụ na ide mmiri nwere ike imetụta, ekwuola ụzọ dị icheiche ha ji diri dị njikere igbochiri ọdachi.
Cheta na Ngalaba na-ahụ ihe gbasara ihuigwe akpọrọ Nigeria Hydrological Agency na Bekee dọrọ aka na ntị ụnyaahụ na ide mmiri si n'oke mmiri ozuzo ga-emetụta steeti iri atọ n'ise na Naịjiria.
Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu n'Enugwu steeti bụ Fidel Ayogu gwara BBC Igbo na-ekwe ntị etu steeti ahụ si akwado.
Ọ sị: "anyị agwaala ndị mmadụ ha kpochapụ ahịhia ebe mmiri si aga maka ị gbochi ide ga-eto ma oke mmiri zoo."
N'Abịa ha na-eme ihe yi kwara nke a ebe Kọmishona ji ọrụ mgbasa ozi ebe ahụ bụ John Okeiyi kwuru na ha na-ekpocha ụzọ niile mmiri ga esi ga n'Aba karịcha.
Gee ihe ha abụọ gwara BBC n'uju ebe a:
Ha niile na ele anya na ihe a ha mere ga-eme ka ide mmiri gharị imebi ihe nke ukwu.