You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụda egbe na-ada n'isi obodo Rivas steeti
Akụkọ na-apụta kwuru na ụda egbe dara n'ụtụtụ a na Pọtakọt Rivas steetị.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gwara okwu n'ekwe ntị bu Victor Eziahama kwuru na ọ bụ ndị agboro APC gbochiri ụzọ ụlọịkpe ga-ekpe maka ntuliaka imeụlọ nke APC ga-eme echi n'obodo ahụ.
Ndị nche nọ n'ụlọikpe ahụ malitere ị gba egbe maka ị chụsa ndị ahụ bịara ị bido nsogbu, ụlọịkpe ahụ gara n'iru ịkpe ma nye iwu gbasara APC
Eziahama si na Ọkaikpe Chinedu Nworgu nyere iwu na ntuliaka imeụlọ APC na-akwado agaghi eme maka ebubo aka-azụ na-aga n'ime otu ahụ.
Ụfọdụ ndị nọ ebe ihe a mere kwuputara ya n'elu soshal midia nke Twitter:
Nke a tipuru mkpu na mbido ọgbaaghara ahụ:
Nke a gosiri ụfọdụ ụgbọala emebiri n'okwu a:
Onye kwuputekwara ebum nuche ya maka ihe mere:
Echi ga-ekwu ma APC a ga-ada iwu ahụ maọbụ ha ga-ejigide ya.
Cheta na ntuliaka imeụlọ nke otu APC mere n'ụbọchị satode gara aga ghọrọ ihe ọgbaghara maka mwakpo mere na mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe dị ịcheịche.
Akụkọ ga-amasị gị: