You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha ekwuola na ha gbapụtara mmadụ ruru 1000 Boko Haram nwụchiri
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha zọpụtara mmadụ karịrị otu puku n'aka ndịagha Boko Haram.
Ha kwuru na ha si n'obodo dị iche iche n'ime Boma dị na Borno steeti zọpụta ha.
Ndị a gbapụtara gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka nakwa ụmụokorobia ndị kwuru na a magidere ha ịlụ agha Boko Haram.
N'ihe ha depụtara na Twitter, ha kwuru na enwere ndị ọzọ tinyeere ha aka, iji gbapụta ndị a.
N'agbanyeghị na ha kwuru na ha agbapụtala ndị eji eji, ha ewepụtaghị foto ọbụla iji gosi ndị ahụ ha gbapụtara.
Nke a bụ ugboro atọ n'ime ọnwa anọ ndị agha na-ekwu na ha gbapụtara ndị mmadụ n'aka ndị Boko Haram.
- N'ọnwa Febụwarị, ha kwuru na ha gbapụtara mmadụ otu puku na otu narị na iri atọ (1,130) nso Sambisa na Lake Chad.
- N'ọnwa Epreelụ, ha kwuru na ha gbapụtara ụmụnwaanyị narị atọ (300).
Ihe ndị ọzọ ha depụtara:
Mgbapụta ndị a akwụsịghị ndị Boko Haram ịkpa mkpa mkpa ha na-akpa.