You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Maina, Metuh na ndị ọzọ bu ahụ ọrịa bịa n'ụlọikpe
Dịka onye bubu onyeisi ngalaba na-elekọta ụgwọ ezumikenka gbụụrụ daa n'ime ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde.
A na-ekpe ya ikpe ruru agba iri na abụọ n'ihe gbasara mpụ, nrụrụaka nakwa mbupu ego.
Maina gbaburu ọsọ mana e mechara anwụchie ya na mba Nijie.
Dịka nke a mere, anyị lebara anya ndị ọzọ bu ọrịa maọbụ dara ọrịa n'ike dịka a malitere inyocha maka ebubo gụnyere nrụrụaka..
Ndị ji akwa bịa n'ụlọikpe:
Dino Melaye
Ụlọikpe abụrụla ebe ngosi etu ndị ndọrọrndọọ ọchịchị ga-esi kwado bịa maka ikpe ha nakwa ụdị akwa ọrịa ha ga-eji bịa.
Ọ bụrụla ihe ngosi na ụfọdụ ndị ndọrọndọọ ọchịchị a na-ekpe ikpe na Naịjirịa maka mpụ maọbụ mmerụaka na-eji ute ọrịa aga n'ụlọikpe.
Onye na-anọchite anya ndị Kogi west na sineti bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye e bu n'ụgbọala e ji ebu ozu na ndị ọịa gaa Kogi steeti ebe ndị uweojii chọọ ikpọga ya ụlọikpe.
Melaye ji akwa ọrịa gaa ụlọikpe ụbọchị Wenezde ebe ọ gara ịnata mgbapụta.
Olisa Metuh
Metuh bụbụ onyeisi ngalaba mgbasaozi nke otu pati PDP jiri akwa ọrịa gaa ụlọikpe n'aAbuja n'ọnwa Feburuwarị afọ a bụ 2018.
A na-ekpe Metuh maka mpụ na mmerụaka ego ruru nde naịra 400.
Ụbọchị o kwesiri igosi onwe ya n'ụlọikpe, e ji ụgbọala e ji ebu ndị ọrịa bute ya n'ụlọikpe ebe ọ nọ n'akwa ọrịa.
E buru ya na akwa ọrịa ya bubata nime ụlọikpe ebe ọ nọ ka onye na-adịghị ndụ.
Tayor wepụtara foto Metuh oge ebu ya banye n'ụlọikpe nime akwa ọrịa.
Diezani Allison-Maduekwe
Nwaanyị bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka mmanụ agbidi, e boro ya ebobo mpụ na mmerụaka.
O jighi akwa gaa ụlọikpe mana ozigbo ikpe ya bidoro, akụkọ akụkọ pụtara na ọ na-arịa kansa.
Teliat Kunle dere n'akara twitter ya n'eziokwu mpụ bụ ọrịa.
Femi Fani-Kayode
A na-ekpebu Kayode onye bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka njem ụgbọelu ikpe gbasara mpụ na ohi ego ruru ijeri dọla anọ n'ụma.
Oge a na-eme ikpe Kayode, ọ gwara ndị ụlọikpe na ya nwere ọrịa mkpụrụ obi.
Nenadi Usman
Nwaanyị a bụbu mịnịsịta okwu ego dị n'aka.
E boro ya ebubo mpụ, aghụghọ na ohi na mkpamkpa ya na Kayode na Danjuma Muhammed.
Oge e bidoro ikpe ya, ọ gwara ndị ụlọikpe ka ha nye ya ohere ịga ụlọọgwụ na mba ofesi maka na ya nwere kansa.
Ndị ụlọikpe nyere ya ohere ahụ ka ọ gaa mba Amerịka maka ọụ̀wụgwọ ya n'afọ 2017.