You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị: Obasanjo akpọpụtala Buhari ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Mpaghara ọdịdaanyanwụ ga-enweta ụgbọelu agha
Ọchị agha elu Naịjirịa bụ Air Marshall Sadiq Abubakar ekwela nkwa iziga ụgbọelu agha anọ n'Enugwu.
Abubakar kwuru na ụụbọelu ndị ahụ bụ iji chekwaa steei ndị dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa
Obasanjo na Buhari
Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ bụ naanị ndị bụ onukwu ga-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari emela nnukwu ihe n'obodo a.
O kwuru iji gọnarị akụkọ na-agagharị na sọshal midia na Obasanjo na-etozi Buhari na ihe ọ na-arụ.
Na mba ofesi
Otu mbaụwa bụ UN adọọla aka na ntị ka onyeisiala mba Amerịka ghara ịgbahapụ nkwekọrịta nkwekọrịta ha na mba Iran mere iji kwụsị Iran imepụta ngwọagha nuklia.
Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres kwuru na e nwere ike inwe agha mbaụwa ọzọ ma Amerịka pụọ na ya bụ nkwekọrịta
Ndị Cambridge Analytica emechiela
N'aka nke ọzọ ndị na-enyocha Cambridge analytica ekwuola na ha mechigodi, ọ gaghị akwụsị nyocha a na-eme ha.
A na-enyocha Cambridge Analytica maka ebubo izu data gbasara ndị mmadụ na Facebook maka ntuliaka ndị Amerịka mer n'afọ 2016.
N'egwuregwu
N'egwuregwu otu egwu bọọlụ Liverpool abaala agba ikpeazụ nke asọmpi Champions Lig agbanyeghi na Roma meriri ha.
Nke a bụ mbụ ha na-eru n'agba nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi kamgbe afọ 2007.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha.