Dino Melaye sị ụlọọgwụ bịa ụlọikpe taa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị uweojii n'Abuja buuru omeiwu Dino Melaye bata n'ụlọ ịkpe taa n'elu akwa.
Cheta na kemgbe izuuka garaaga ka ndị uweojii na-eche Melaye nche n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụ.
Dino Melaye meruru ahụ oge o sị mpio ụgbọala wụpụo mana okaiwu ya kwuru na ọ bụ ndị uweojii kwapụrụ Dino Melaye.
Ndị ntaakụkọ Sahara Reporters dere na ọkaịkpe kpebiri na ọ bụ nde naira 90 ka ha ga-eji were nye Melaye ohere ka ọla be ya wee ruo mgbe ipe ya ga eru.
Ndị uweojii na-ebo Dino Melaye bụ onye omeiwu na nọchịte mpaghara ọdịda anyanwụ nke Kogi steeti ebubo na o nyere ndị na-akwado ya ngwa agha.
Mana Melaye kwuru na ebubo a bụ asị.
Ụfọdụ nsogbu Dino Melaye nwere
Dino Melaye na gọvanọ Kogi anaghị ahụ ibe ha anya na anya n'agbanyeghị na ha nọrọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'ime izuụka garaaga, Melaye meriri na nyocha ngalaaba na-ahụ maka ntuliaka mere maka mkpọghachị azụ achọbụrụ ime ya.

Akụkọ ga-amasị gị:









