You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'abalị a: Gọọmentị Enugu steeti eziela ozi ọṅụ
Akụkọ ndị kachasị n'ụtụtụ a
Gọọmentị Enugu steeti ewepụla ego karịrị otu ijeri naira a ga-eji kwu ndị ọrụ steeti ahụ ego ezumike nka.
Ha sị na-ego ga n'abịa dịka nde narị naira kwa ọnwa bido n'ọnwa Mee.
Ha ga akwụkwa ego ụgwọ ụlọ ha sị n'akpa ndị orụ weputa.
Ọzọ...
Nzụkọ Kim Jong-un nke Nọt Korea na Moon Jae-in nke Saut Korea amịtala mkpụrụ
Mba abụọ ahụ bubu nwanne ekwekọrịtala ị kwụsị esemokwu ruru afọ ịrị ise dị n'etiti ha.
Ebe ọzọ na Naijiria
Ụlọikpe ukwu na Legos enyela iwu ka atọghapụ Sinetọ Nwaoboshi mana ọ gaghị adị mfe.
Ha nyere Nwaoboshi ụbọchị atọ iji kwụ ihe ruru naira nde iri ise ma nyekwa ụlọikpe akwụkwọ njem ya tupu atọghapụ ya n'ezie.
Na akụkọ egwuregwu
Onye nkuzi otu Arsenal na-apụ apụ n'oge adịghị anya kwuola na ọ chọrọ ka ọnwa ikpeazụ ya ga n'udo.
Cheta na Arsenal na-akwadọ asọmpị ha na Manchester United echị
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ ụtụtụ a na nkeji