You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe 5 dị n'akpa gị e nwere ike ịkpọga gị nga?
Enwere ike ịnwụchi gị maka ibu mmiri ose n'akpa?
Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na mmiri ose so na ngwaọgụ amachiri amachi na Naịjirịa, ya mere na enwere ike ịkpọchi gị ma a hụ ya n'akpa gị.
Otu onye akpọrọ @yoitspizzu pụtara na Twitter ịjụ onye na-esote onyeisi ndị uweojii na Legọs bụ Abayomi Shogunle ihe mere eji nwụchie ya n'ụlọọrụ ndị police dị n'Igando maka mmiri ose o tinyere n'ime akpa.
Shogunle zara ya sị ya na ihe o mere dị njọ, maka na mmiri ose ahụ bụ 'ngwaọgụ amachiri amachi'.
Gịnị ka a ga-akpọnwu ngwaọgụ?
BBC kpọrọ onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti, o wee kọwaa ihe mere mmiri ose ji bụrụ ngwaọgụ.
Oti kwuru na enweghị iwu ọbụla kwuru na mmiri ose dị njọ, mana enwere ụfọdụ iwu a ga-ejinwu jichie onye ọ bụla ji mmiri ose.
Ọ sị kwa na onweghị mmadụ ọ bụla nwere ikikere iji mmiri ose n'akpa ha mana ọ sị na mmiri ose dị iche n'anwụrụ ose ndị uweoji maọbụ ndịagha ji arụ ọrụ ha.
Oti kwukwara na dịka mkpebi ndị UN siri kwuo, na a ga-akpọnwu mmiri na anwụrụ ose, ngwaọgụ kemịkal.
Ị ga-aganwu nga?
N'otu aka ihe Shogunle kwuru, kedụ ihe ise nwere ike itinye gị na nsogbu ma ọ bụrụ na ndị uweojii hụ ya n'akpa gị?
1. Mmiri ose
2. Mma
3. Agụba
4. Mkpa
5. Okwute